NAFDAC amaala ọkwa banyere shuga adigboroja esiri Brazil na India bubata

Chinwendu Uzoatu dere akụkọ ndị a ỤLỌỌRỤ na-ahụ maka erimeri na ọgwụ n'ala anyị National Agency for Food andDrug Administration (NAFDAC) emeela ka ọhaneze mata banyere shuga (sugar), nke iwu akwadoghị e si nba Brazil and India. Ozi si n'aka ndịisi NAFDAC kọwara na ha amaghị anya shuga ahụ n'ihi na edebanyeghị ya n'aka ha, tinyere na o nweghị 'vitamin A', nke mere na ntụbata a tụbatara ya, na ire ya n'ahịa jiri bụrụ nnukwu ihe iche aka mgba n'ebe ahụike ndị mmadụ na-egoro ya nọ. Dịka ozi ahụ siri dị, a tubatara shuga ahụ site na Cameroun (Douala), Niger, Chad na Benin Republic were ruo agbata oke Nigeria (border) buga steeti Borno, Adamawa, Lagos, Oyo na Ogun. Ozi ahụ gara n'ihu rụtụ aka na e bubatala ihe juru ụgbọala e ji ebu ibu 'truck' narị abụọ ma kesasịa ha n'ahịa dị iche iche na Nigeria; ebe ndị gunyere Mubi, Gamboru'gala, Saki, Keshi, Badagry na Idi-Iroko ma na-ere otu akpa n'ọnụego nọ n'agbata puku