Uru na ọghọm dị n’udu mmiri
UDU mmiri bụ oge mara mma n’ihi na Chineke hụrụ ihe o kere bụ mmadụ n’anya wee hazie oge ọ bụla na mgbe ya. Udu mmiri bụ oge ihe nile a kụrụ n’ubi ji eto ma na-emekwa nke ọma. N’ezie oge mmiri na-amalite, ahịhịa nile na-enweta ndụ ọhụrụ, ma mmadụ ma osisi dị n’ọhịa na-ańụrị ọńụ n’ihi mmiri ma o bidosie. N’oge mmiri ozuzo, osisi na ahihia nile na amalite rube akwụkwọ ọhụrụ. Ala n’onwe ya na enwetakwa ndụ n’ihi na ọ na-adịkwa nro maka ịkọ ihe na ị kụnye mkpụrụ dị iche iche. N’oge mmiri ozuzo, ebe nile n’ajụ oyi. Mmadu nile na-alahụ ụla nke ọma. Ọ dị ọtụtụ uru a na-enweta n’oge udu mmiri . Na mbụ, ọ bụ oge e ji akọnye ihe n’ala dịka ji, akpụ, ọka, nduku, jioko, unelle, ọkanwajata, ose, ọkọrọ na akwụkwọ nri dị iche iche. Ọ dịkwa ọtụtụ ihe ọzọ a na-akọ n’oge udu mmiri ohere agaghị ekwe ka e depụta na ebe a. Oge mmiri ozụzo bụ oge e ji enwe ụbara ihe oriri n’ala ọ bụla. Malite na ọnwa isii nke afọ ọ bụla, ọka na-ejụpụta ahia nile ma ube eji ata ya na kwa akioyibo. A na-enwe ubara mkpụrụ