Nri ndị Igbo: Ọka na ube
NRI ndị Igbo bụ ọ pụrụ iche. Nri niile ndị Igbo na-eri nwere mgbe e ji eri ya. Ụfọdụ ihe oriri nwere mpaghara ji nri ahụ eme mmemme, nrị dịka ji, ụkwa, ọka, achịchị na abacha nwere ndị ọ ga-abụ ị bịara ha mmemme ha ga-esirịrị ya. Anyị ga-eleba anya n’otu ndị Igbo si eri ọka. Ọ bụ ezie a na ha adịghị akọpụta sọọsọ ya mana Igbo maara ka e si eri ya nakwa uru ọka bara. Igbo ji ọka esi ụkwa, ha na-eme ya ịgbaọka, ha ji ọka esi ụkwa,ha ji ọka eme agidi, ha na-ahụ ya n’ọkụ, were ube, aki oyibo maọbụ akị were taa ya. E jechaa ugbo lata, I 8sinye ọka, o ghee I ruo ube na mmiri ọkụ were ya taba ọka. N’ezie I tachaa ube na ọka ahụ ajụọ gị oyi. Ọka bụ ezigbo nri.