Posts

Showing posts with the label sinọọdụ ahọ 2021

Dayọsiisi Angilikan Niger emeela sinọọdụ ahọ 2021

A KPỌKUOLA ma dụọ ndị mmadụ, ọkachasị ndị ụka ka ha bụrụ ndị na-edebe okwu Chineke ma na-emekwa ya oge niile ka ihe wee gaara ha nke ọma.   Òkù a bụ nke a kpọrọ site n’ọnụ Bishọọpụ ụka Angịlịkan na dayọsiisi mpaghara Niger, bụ Bishọọpụ Owen Nwokolo, n’okwu ya na mmemme ọgbakọ sinọọdọ dayọsiisi ahụ nke ahọ 2021.   Ya bụ sinọọdụ bụ sinọọdụ nke atọ n’ime àgbà sinọọdụ nke iri atọ na otu dayọsiisi ahụ na-eme, ma bụrụkwa nke weere ọnọdụ n’ụlọụka ‘St. John’s Anglican Church’ dị n’obodo Eziowelle, n’okpuru ọchịchị ime obodo ‘Idemili North’ nke steeti Anambra.   N’okwu ya n’ebe ahụ, nke gbadoro ụkwụ n’isiokwu ọgbakọ sinọọdụ ahụ, bụ “Bụrụ Ndị Na-Eme Okwu Ahụ; Abụla Naanị Ndị Na-Anụ Ya Anụ”, Bishọọpụ Nwokolo kọwara na ndụ ezi onye òtù Christ bụ ngosipụta ụdịdị Chineke na ịgbaso usoro o si eme ihe, ọbụladị dịka ọ kpọkuru ndị ụka ka ha bụrụ ndị òtù Christ n’eziokwu ma na-egosipụta ya n’okwu ọnụ ha na omume ha oge niile.   Dịka ọ na-akatọ etu ụfọdụ ndị ụka si eme omume anaghị egosi na ha bụ ndị òtù