Posts

Showing posts with the label sinọọdụ 2021

Ebenator ebuola sinọọdụ afọ 2021 nke dọyọsiisi Amichi

Ọ DARA ụda ma kpọtụọ akpọtụọ n’isi ịgwụcha izuụka gara aga, dịka dayọsiisi Amichi nke ụka Angịlịkan chịkọtara mmemme sinọọdụ ya nke ahọ 2021 n’ụdị pụrụ iche.   Ya bụ sinọọdụ bụ àgbà nke mbụ n’ime sinọọdụ nke ise nke dayọsiisi ahụ, ma bụrụkwa nke weere ọnọdụ n’ụlọụka ‘St. Andrew’s Anglican Church, Ebenator’ dị n’okpuru ọchịchị ime obodo ‘Nnewi South’ nke steeti Anambra, malite n’abalị abụọ nke ọnwa Juunu a wee ruo n’abalị isii, bụ ụbọchị ụka.   Sinọọdụ ahọ a, nke ọ bụ Ebenator Ashdikinri (Ebenator Archdeaconry) buru ya, dọtàrà ọtụtụ ndị bishọọpụ, ndị ọrụ ụka, ndị ọrụ gọọmentị na ndị ọzọ selitere isi na ngalaba dị iche iche, bụ ndị siri ebe dị iche iche na gburugburu ala Nigeria wee bịa.   N’ozi ya pụrụ iche ọ gụpụtara na sinọọdụ ahụ nke a kpọrọ ‘Bishop’s Charge’, Bishọọpụ dayọsiisi Amichi, bụ ‘Rt. Rev.’ Ephraim Okechukwu Ikeakor kpọpụtasịrị ihe dị iche iche dayọsiisi ahụ mepụtàrà, ya na ihe dị iche iche megasịrị na dayọsiisi ahụ na n’ụka Angịlịkan n’ala Nigeria n’ime ótù ahọ gara aga, m