NIMASA etiela ndị iju mmiri wakpòrò n'afọ 2018 aka n'obi
DỊKA ótù ndị ọrụ agha mmiri ala anyị a maara dịka “Nigerian Maritime Administration and Safety Agency” (NIMASA) etiela ndị ahụ iju mmiri wakpòrò na steeti Anambra n’ahọ 2018 aka n’obi, ma sị ha dìbé, site n’ịtụrụ na ibunye ha ọtụtụ ihe enyemaka na ihe erimeri dị iche iche iche. Iti aka n’obi a bụ nke ndị òtù ahụ bịara me n’Awka bụ isi obodo steeti Anambra, ma bụrụkwa onyeisi ụlọ ọrụ na-ahụ maka ọnọdụ ntụmadị na steeti ahụ, bụ ụlọ ọrụ “Anambra State Emergency Management Agency” bụ Maazị Paul Odenigbo nabàtàrà n’aha gọọmenti steeti ahụ. Ndị ahụ bụkwa ndị buru ọtụtụ ihe erimeri na ihe e ji akwalite ọnọdụ obibi ndụ wee bịa ya bụ njem iti aka n’obi, nke gụnyere akpa osikapa, akpà nnu, mmanụ, ihe ọñụñụ dị iche iche, àkwà edinà, igwe e ji akwa ákwà, àkpà fịọ-fịọ, tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ. N’okwu ya dịka ọ na-enyefè ihe ndị ahụ n’aka steeti Anambra, onyeisi ụlọ ọrụ NIMASA n’ala anyị, bụ maazị Dakuku Peterside, nke onyeisi ngalaba na-ahụ maka inyòcha akpa ego, bụ maazị Victor Ọnụzuruike nọchit