E jidela otu onye aka ya dị n'ogbugbu onyeisi obodo Nimo
DỊKA e kwuru sị na ihe ọ sọrọ nchì ya zogharịba n’ahịhịa, anya ga-ahụrịrị ya otu ụbọchị; aka ndị uwe ojii na steeti Anambra akpàrálá otu onye n’ime ndị ahụ a na-enyo ènyò na aka ya dị na mgbagbu ahụ a gbàgbùrù onyeisi ọchịchị obodo Nimo dị n’okpuru ọchịchị Njikọka, bụ maazị Frank Anthony Igboka. Onyeisi ndị uwe ojii na steeti ahụ, bụ maazị Mustapha Danduara mere ka a mara nke a n’isi ụlọ ọrụ ndị uwe ojii dị n’Amawbịa, oge ọ na-akpụgharị ya bụ nwa amadi, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ a nwụchikọrọ maka itinye aka n’arụrụala dị iche iche, dịka otu nzuzo, izu ohi na ịtọrọ mmadụ. Nwata nwoke ahụ aha ya bụ Chigbo Aniegbu, onye a maara dịka “Transformer” gbàrà ahọ iri abụọ na asaa ma bụrụkwa onye e kwuru na o bụ onye Nimo, bụkwa obodo ya bụ nwa amadi e gburu egbu. Dịka maazị Danduara siri kwuo, kemgbe ụbọchị ahụ e jiri gbuo maazị Igboka, bụ n’abalị iri na isii nke ọnwa Epure n’ahịa Oye Nimo, ndị uwe ojii steeti ahụ bagidere n’ịchụ nta ịnwụchikọọ ndị ahụ kpara ya bụ arụ, bụzị nke e siri na ya wee nwục