N'Ogun, e jidela nwaanyị dunyere ndị mmadụ ka ha tọrọ di ya
NDỊ uweojii n’ime steeti Ogun anwụchiela otu nwaanyị, bụ Memunat Salaudeen maka ịkwụ ndị mmadụ ụgwọ ka ha gaa tọrọ di ya, ka e wee napụta ha ego. Nwaanyị ahụ bụ onye a nwụchikọrọ ụbọchị Mọnde, ya na ụmụnwoke atọ ahụ ọ kwụrụ ụgwọ ka ha tọrọ di ya, nke gụnyere Maazị Olayinka Lawal, Asungba Nura and Usman Oluwatoyin. N’okwu ya banyere nke ahụ, onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii n’ime steeti ahụ, bụ Abimbola Oyeyemi kọwara na ọ bụ oge o jiri ọkara gata elekere isii nke uhuruchi ụbọchị Mọnde ka e jidere ndị ahụ na mpaghara okporouzụ Papa gaa Itori; ma kọwaa na ndị ọrụ uweojii ahụ nwụchiri ndị ahụ oge ha bu ọgbaatumtum, n’ihi na ha dị ka ndị a na-enyo ènyò. O kwuru na ndị uweojii ahụ jidekwara ha, kpọsàá ha, ma gbaa ha ajụjụọnụ n’otu n’otu banyere ihe ha na-eme na mpaghara ahụ, ya na ihe mere ha jiri jide mmà na eiri. Ọ bụzị oge a na-agba ha ajụjụọnụ ka ha nọrọ wee sàá asịsà na nwaanyị ahụ kwụrụ ha naanị puku naịra asatọ (N8000) ka ha wee gote mma na eriri siri ike iji