Posts

Showing posts with the label onye Isi ala

Igbusi ndị mmadụ na Plateau: Onye kwuru na m gbara nkịtị? – Buharị

ONYEISI ala anyị bụ Muhammadụ Buharị akọwaala ya dịka nkọghèri na asị ocha ghe anya oghe, bụ akụkọ ahụ ndị mmadụ na ebugharị na-asị na o nweghị ihe ọbụla nwere isi o kwuru banyere mgbusi ahụ e gbusiri imirikiti ụmụ mmadụ aka ha dị ọcha na steeti Plateau n’izu ụka gara aga site n’aka ndị Fụlani, ma gọọ aka na ọkpa ya banyere nke ahụ, ọ bụnadị dịka o mere ka a mara na o kwuru ihe o kwesiri ikwu.   Nke a bụ nke e mere ka ọ pụtakwuo ihè site n’aka nnukwu onye enyemaka pụrụ iche nye ya bụ onyeisi ala na mgbasa ozi, bụ Mazị Garba Shehu, bụ onye mekwara ka a mara na Buharị kwuru okwu banyere mgbusi ahụ oge ya na ndị e ji okwu ha agba izu na Jọs nwere nzukọ iji kpaa banyere nke ahụ. Onyeisi ala n’onwe ya bụ Buharị akatọọla kpam kpam otu ndị mmadụ si ekwu na o nweghị ihe ọ bụla nwere isi o kwuru banyere ọnọdụ ahụ n’ihi na ya onwe ya dịkwa ka otu onye n’ime ndị Fụlani ahụ na-achị ehi; o wee kpọkuo ụmụafọ Nigeria ka ha ghara ịña ntị n’akụkọ ahụ ọ kọwara dịka nke enweghị isi na ọdụ, dịka o kwuru n