Posts

Showing posts with the label okpukperechi

Ịkwalite udo na ihunanya n'etiti okpukperechi dị iche iche

OTU ‘United Nation’ wepụtara izuụka izizi n’ọnwa Febụwari ka ọ bụrụ nke e ji enwe ọgbakọ maka ịkwalite udo na ihunanya n’etiti okpukperechi dị iche iche n’ụwa nile nke a kpọrọ ‘World Interfaith Harmony Week’. A na-eme nke a afọ ọ bụla, ya mere kemgbe otu izuụka ka a na-eme ya wee ruo taa. Ọ bụ ka ọnwa Oktoba dị n’abalị iri abụọ n’afọ 2010 ka e kpebiri ime ya. Na mkpebi ahụ ka a rụtụrụ aka na ezi nghọta na mmekọrita dị n’etiti okpukperechi dị iche iche na-akwalite udo. Ọ bụ ya ka ha ji hibe otu izuụka maka nke a iji wee kwalite mmekọrịta n’etiti mmadụ nile n’agbanyeghị okpukperechi na nkwenye ha. N’ihi uru ọ bara bụ nnọkọ na mkparịta n’etiti ndị nwere okwukwe dị iche iche tinyekwara okpukperechi iji nwe ezi mmekọrịta ndị otu ‘General Assembly’ na-agwa steeti nile ka ha gbasaa ozi a ụwa nile; site n’ụlọụka, ‘Mosques, Synagogues’ na ebe dị iche iche ndị mmadụ na-ekpere chi ha. O kwesịrị ka mmadụ hụ ibe ya n’anya ma na-akwado ya. E wepu udo na ihunanya, ụwa agaghị ekwe obibi. Ọ na-abụ ihe