Posts

Showing posts with the label okporoụzọ Onitsha-Owerri

Ụgbọala bu mmanụ ọkụ atọla ebe ụzọ kewara abụọ n'okporoụzọ Onitsha-Owerri

OKPOROỤZỌ awara-awara ahụ siri Onitsha wee gaa Owerri nọrọ ụbọchị Mọnde wee kebie abụọ, n’ihi mbize na-eme mkpamkpa na mpaghara ahụ, ya na n’ihi oke mmiri ozuzo ahụ zoro na nsonso a.   Ka ọ gachara áwà olenaole nke ahụ jiri mee, otu nnukwu ụgbọala e ji ebu mmanụọkụ danyere ma tọkịrị n’ime ebe ahụ ụzọ kèwàrà abụọ, ụfọdụ mmanụọkụ o bu wee wụfuo.   Dịka akụkọ siri kọọ, ụgbọala ahụ bu mmanụọkụ na-ewèchara ọsọ n’okporoụzọ ahụ, wee ruo mgbe ọ danyere ma tọkịrị n’ime ebe ahụ mbize kewara abụọ.   N’okwu ya banyere nke ahụ, onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka njem awele, bụ ụlọọrụ ‘Federal Road Safety Corps’ (FRSC) n’ime steeti ahụ, bụ CC Adeoye Irelewuyi kwuru na ụgbọala ahụ si otu ebe buru mmanụọkụ ahụ wee na-aga igbapụ ya tupu nke ahụ wee mee,. Ọ kọwakwara na ha egbochiela akụkụ ụzọ ahụ mebiri emebi iji kwụsị ndị mmadụ ịgba na ya, maka ọnwụ.   O nyere ndị mmadụ, ọkachasị ndị na-anyà ụgbọala ndụmọdụ ka ha kwụsịzie ịgba ụzọ ahụ ma gbabazie ụzọ ndị ọzọ, ọbụladị dịka o nyere owuweanya na ndị ọrụ ya nọ ọr