Posts

Showing posts with the label nwa nwoke

Uru nwa nwoke bara n'ala Igbo

NDỊ Igbo nwere nkwenye dị egwu na ezinaụlọ ọbụla ga-enwerịrị nwa nwoke. Ha kwetara na ezinaụlọ enweghị nwoke ga-ekpochapụ kpamkpam. Ọ bụ n’ihi nke a ka oge ụfọdụ, ezinaụlọ enweghị nwa nwoke ji ahapụ otu nwa ha nwaanyị n’ụlọ ka o nwee ike mụtara ha nwa nwoke ka o were lụbata nwaanyị n’ụlọ. Ọ bụkwa n’ihi amụtaghị nwoke ka e ji ahụta n’ezinaụlọ ụfọdụ, ebe nwaanyị na-alụ nwaanyị ibe ya. A lụbata nwaanyị ahụ, ezinaụlọ ahụ ahazizie ka ọ ga-esi na-atụ ma na-amụrụ ha nwa. Site n’ụzọ dị otu ahụ,a mụtara ezinaụlọ ahụ nwa nwoke.   Ezinaụlọ ọbụla na-agba mbọ ịhụ na nwata nwoke ọbụla rugoro ihe e ji mmadụ eme lụrụ nwaanyị n’oge o kwesịrị; ka o wee mụta nwa ma si n’ụzọ dị otu ahụ mee ka ezinaụlọ tinyere obodo, na-aga n’ihu, ka aha na oke ezinaụlọ ahụ gharakwa ifu n’obodo. N’ala Igbo, ezinaụlọ enweghị nwa nwoke, enweghị oke n’obodo.   Ha enweghị oke nke ha na-enwe onye na-ekwuru ha. N’ihi nke a, nwoke ọbụla torugoro ogo ịlụ nwaanyị, ma ọ lụghị nwaanyị a na-akpọ ya aha dị iche iche, ma na-ewekwa ya dị