Posts

Showing posts with the label njem Alansọ

Ndị otu Christ na-aga njem Alansọ ga-esi ọdụụgbọelu Jos zọpu ije

ODEAKWỤWKỌ otu na-ahụ maka njem Alansọ nke ndị otu Christ, nke a kpọrọ Nigeria Christian Pilgrims Commission (NCPC) bụ Rev. Yakubu Pam ekwuputala na ndị Nigeria ga-aga njem 2020 ‘pilgrimage’ ga-esi na ọdụụgbọelu Yakubu Gowon Airport, Haipang, Jos wee gaba Isreal.   O kwuputara nke ahụ oge a nọ na nleta otu ọnọdụ ihe ndị e ji arụ ọrụ siri gbata kwụrụ n’ọdụụgbọelu ahụ bụ Yakubu Gowon Airport, Hiapang, Jos ebe Odeakwụkwọ Gọọmenti Plateau, Ọkammụta Danladi Atu nọrọ kwuo na ọ baghịzị uru ndị njem ahụ ịga Abuja tupu ha zọpụ njem gaba Isreal.   O kwuru sị: “Ọńụ m bụ na ndị njem Alansọ (pilgrims) ga-agaba Isreal maka 2020 ‘pilgrimage’ site na Yakubu Gowon Airport Jos; na site n’amara Chineke, 2020 ‘pilgrims’ ga-esi Nigeria gaa Isreal agaghịzị aga Abuja. Anyị ga-ezipụ ha site na Jos wee gaa Isreal.”   Onyeisi (manager), Yakubu Gowon Airport, Maazị Ayinla Olufemi kwuru si na e wepụ ihe iche akamgba akọrọngwa ‘furniture’ na igwe ọrụ e ji enyocha ihe (scanning machine) n’ọdụụgbọelu ahụ na ihe ọrụ