Posts

Showing posts with the label ndị tọọrọ

Ndị uweojii ejidela ndị tọọrọ ụmụaka ise n'Anambra

E MEELA ka a mara na oge adịghị anya, na ọrụ ga-akụrụ ọnụ n’àkwà mmiri Nengo ahụ a na-arụ na Nteje dị n’okpuru ọchịchị Oyi nke steeti Anambra. Kọmishọna steeti ahụ na-ahụ maka ịrụnye okporo ụzọ, ichekwaba ha na ilekọta ha anya, bụ Maazị Marcel Ifejiọfọr, mere ka a mara nke a n’okwu ya na njem ileru anya mara ka ọrụ si aga na ya bụ àkwà mmiri. O gosipụtara afọ ojuju ya bànyere otu ya bụ ọrụ si agawanye n’ihu n’ihu, ma tookwa ụlọ ọrụ ji ya bụ ọrụ ngo, bụ ụlọ ọrụ ‘TAMAD Construction Ltd. n’ihi otu ha si arụ ya bụ ọrụ n’ogoogo a chọrọ. Maazị Ifejiọfọr, onye kwara àrịrị banyere ihe nhịa ahụ ndị mmadụ na-agabiga n’okporo ụzọ awara awara ahụ siri Enugu gaa Ọnịtsha, gara n’ihu gosipụta ezi olile anya o nwere na a ga-arụchapụ ya bụ àkwà mmiri n’oge a tụrụ anya. O mere ka a mara na ọchịchị nọ ugbu a na steeti ahụ bụ nnọọ nke nwere ezi mmetụta banyere ọnọdụ ụmụ mmadụ, ma kwe nkwa na ya bụ ọchịchị Gọvanọ Willie Obianọ ga-aga n’ihu n’ịgbata ọsọ enyemaka n’ebe dị iche iche ọnọdụ dị añaa na steeti ah