A mala ụmụnne abụọ ikpe ọnwụ maka izu Blackberry
ANYAMMIRI gbàrà ka osimiri n’otu ụlọikpe dị na steeti Lagos, dịka a mara ụmụnne abụọ ikpe ọnwụ maka izu ohi. Ụmụnne abụọ ahụ bụ Genesis Ezebong na Micheal Ezebong, nàkwà otu onye ọzọ bụ Ikade Moses ka e kwuru na ha gara ohi dara ụda na mpaghara Palm Groove nke steeti Lagos. Ndị ahụ bụ ndị a kpụgharịbụrụ ụlọikpe n’abalị iri na asatọ nke ọnwa Disemba ahọ 2021, ebe malitere ikpe ha ikpe n’abalị iri na otu nke ọnwa Jenụwarị ahọ a, kpegide ya ruo mgbe a kabiri ya bụ ikpe site n’aka Justice Oluwatoyin Taiwo. Dịka akụkọ siri kọọ, ụmụnne abụọ ahụ na onye òtù ha jiri mma, shọveel na akụrụngwa ndị ọzọ wee wakpo ụlọ otu nwoke bụ David, bí na 222 Ikorodu Road, Palm Groove, Lagos, n’abalị iri na atọ nke ọnwa Jenụwarị ahọ 2019, wee ga zukọsịa ihe ya, nke gụnyèrè ekwentị Blackberry, Compact Laptop, Apple laptop, mgbanaka na mgbanolu ya e jiri ọla edo wee mee, akpụkpọ ụkwụ ya, tinyéré ekwentị abụọ ọzọ bụ ekwentị otu nwoke ọzọ bụ Titilope Akeredolu. Ka e mèchààrà nwụchikọọ ma kpụpụ ndị ahụ ụlọi