Anambra nwèrè ndị nkụzi ma ihe ekwe na-akụ — Soludo
AKA na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Chukwuma Soludo etoola ndị nkụzi steeti Anambra dịka ndị ma nke ekwe na-akụ ma bụrụkwa ọkaibe na ngalaba nkụzi ha dị icheiche. Gọvanọ Soludo kwupụtàrà nke a oge ọ na-anabata ndị nkụzi ahụ nwetere nturuùgò n’onyinye nkwanyeùgwù ahụ a na-enye ndị nkụzi kacha mee nke ọma n’ala Nigeria n’ime afọ ọbụla, bụ nke a maara dịka ‘Presidential Award’ maọbụ ‘President’s Teachers, Schools Excellence Award’. Ọ dị ncheta na ndị nkụzi sitere ụlọakwụkwọ dị icheiche na steeti Anambra sò na ndị nwetara nturuùgò na nkwanyeùgwù ahụ na ya bụ mmemme nke afọ a, bụ nke weere ọnọdụ na nsonso a. N’okwu ya oge ọ na-anabata ndị nkụzi ahụ n’ebe obibi Gọvanọ dị n’Amawbia, Gọvanọ Soludo kọwàrà ndị nkụzi dịka ndị bara oké uru ma dịkwa oke mkpa n’obodo ọbụla, n’ihi na a na-esi n’ụdị ndị nkụzi obodo ọbụla nwere wee mara ọdịnihu obodo ahụ. Gọvanọ Chukwuma Soludo (nke mbụ n’aka ekpe) oge ọ na-agwa ndị sonyere nà mmemme ahụ okwu O kwukwàrà na ọrụ nkụzi bụ ọrụ e ji mmasị, ọnụ̀nụ̀o