A sịla ndị na-achị ehi pụọ n'Anambra East na West
DỊKA a sị na mbịara mbịara emeghị ka mbịara mbịara, di bi ụlọ emee ka di bi ụlọ, e nyela ndị niile na-achị ehi n’obodo dị iche iche dị n’okpuru ọchịchị Anambra ‘East’ na Anambra ‘West’ iwu ka ha chịkọrọ ehi ha pụọ na mpaghara ahụ ozigbo ozigbo. Aka na-achị steeti ahụ, bụ Gọvanọ Willie Obianọ nyere iwu a n’okpuru ọchịchị abụọ ahụ n’okwu ya na njem ịsị ndị okpuru ọchịchị ahụ ‘Daalụ nụ’ maka nkwàdo dara ụda ha nyere ya na otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị APGA na nhọpụta ọkwa gọvanọ ahụ e mere na steeti ahụ. O mere ka a mara na òtu pụrụ iche e hibèrè maka ilebà anya na nsogbo ahụ na-adapụtakarị n’etiti ndị na-achị ehi na ndị ọrụ ugbo na mpaghara ahụ ga-ahụ na e mere nke ahụ n’ụzọ ikpe nkwụmọtọ site n’ịhụ na a kwụgharachiri ndị ọrụ ugbo ahụ ụgwọ maka ihe ha kọrọ n’ubì e bibìsìrì ebibi, ka udo wee chịa. N’ịgbasò udo na iji hụ na otu ndọrọ ndọrọ APGA nwetara mmeri dara ụda na nhọpụta izugbe ahụ na-abịa n’ihu, Gọvanọ Obianọ nọkwara n’ọgbakọ ahụ wee mághèpù mmachi ahụ a màchìrì mmadụ atọ ndị ụlọ ọgbakọ