Posts

Showing posts with the label ndị ụka 'Anglican

N'Imo, ndị ụka 'Anglican' emeela ngagharị ka bishọọpụ ha nye ohere

Chinwendu Uzoatu   IMIRIKITI ndị ụka ‘St Mary Magdaline Cathedral Anglican Communion’ nke dị n’okpuru ọchịchị Oguta na steeti Imo, agwala onye isi ụka ha, Bishọọpụ Chijioke Benjamin Oti, ka o nye ohere n’ụlọụka. Ha gbara iwe ma buruchaa mpempe akwụkwọ ha depụtachara ebumnuche ha na ya nọchie ọnụ ụzọ ụlọụka ahụ. Ha nọ na-ekwu na ọmasịghị ha otu ihe si aga n’ụlọụka ahụ. Ndị ụka ahụ na ngaghari iwe ahụ kwuru na o wutere ha otu o si wepu otu ụkọchukwu ha bụ ‘Rev’ Jasper Chikwe n’ihi ebubo; ha kwukwara na bishọọpụ ahụ egeghị nti na mbọ ndị okenye ụka ahụ gbara iji lebaa okwu ahụ anya ka udo wee chịa. Maazị Isreal Onyeoyibo kwuru na ụlọụka ahụ anaghị amịta mmịmị otu o kwesiri n’okpuru ọchịchị Bishọọpụ Oti. Ọ gara n’ihu kwuo na ọ na-achị ha n’aka ike dị egwu nke bụ na ụtụ (levy) na-achọzị igbu ha. Dịka o siri kwu; “N’okpuru Bishọọpụ Oti, ihe esila na Kraist pụọ na-agazi n’ego; nke a na-akpata ọtụtụ nsogbu. Site n’ụzọ dị otu a, ndụ mmụọ nke ụlọụka a na-anwuzi anwụ.” N’aka nke ya, Oriaku Joy Nn