Anambra ebidola ikesàrà ndị ọrụ ugbo mkpụrụ ihe ubi
KA ọ gachaara ihe dịka otu izuụka gọọmentị steeti Anambra jiri mechaa mmemme ịgbape amụmà ịkọ ọrụ ugbo udummiri nke ahọ 2021, ụlọọrụ na-ahụ maka ọrụ ugbo na steeti ahụ amailtela ikesàrà ndị ọrụ ugbo steeti ahụ mkpụrụ akụkụ dị iche iche e ji akọ ugbo maka ịkọ ọrụ ugbo nke ahọ a. Mmemme ikesà akụrụngwa a bụ nke a na-eme n’okpuru ọchịchị ime obodo dị iche iche na steeti ahụ ma bụrụkwa nke a màlitèrè n’okpuru ọchịchị ime obodo Anaọcha na Dunukọfịa. Atụmatụ a bụ mgbakwụnye na mmemme ịgbape ọrụ ọrụ ugbo ahụ Gọvanọ mere n’izuụka gara aga. Ihe ubi nà mkpụrụ akụkụ dị iche iche e kesààrà ndị ahụ gụnyèrè okpòròakpụ/osisi akpụ TME 4-19, tomatò, mkpụrụ ọkwụrụ, mkpụrụ ọkà, nà mkpụrụ akụkụ ndị ọzọ, ma bụrụkwazie nke e kesààrà ha n’efù maka ịkọ ọrụ ugbo udummiri nke ahọ a. N’okwu ya n’ebe ahụ, nnukwu onye enyemaka pụrụ iche Gọvanọ Obianọ n’ihe gbasaara ọrụ ugbo, bụ Maazị Obioma Mbanefo kọwàrà ọrụ ugbo dịka ihe dị óké mkpà n’ihi ọtụtụ uru dị iche iche dị na ya, nke gụnyere na ọ na-enye ego ma na-