Posts

Showing posts with the label ndị ọlụ ahụike

A dụọla ndị ọlụ ahụike ka ha dị uchu n'ọlụ

Izunna Okafor   A KPỌKUOLA ma dụọ ndị ọrụ ahụike ka ha gaa n’ihu n’itinye uchu n’ọrụ ha ma werekwa ya dịka ọkpụkpọ òkù iji wee mee ka mma ọrụ ha pụtawanye ihè. Aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ nyere ndụmọdụ a ma kpọọ oku a dịka o guzobere otu jikọtara ndị ọrụ ahụike na mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ ala anyị, bụ nke weere ọnọdụ n’isi ụlọ ọrụ steeti ahụ dị n’Awka, ma bụrụkwa nke dọtara ndị ọrụ ahụike sitere steeti ise dị na mpaghara ala Igbo. N’okwu ya ka ọ na-eguzobe ndị otù ahụ, Gọvanọ Obianọ, nke onye nọchitere anya ya bụ osote onyeisi ngalaba na-ahụ maka ọgwụ n’ụlọ ọrụ steeti ahụ na-ahụ maka ahụike, bụ Maazị Azụbụike Nwizu toro ndị òtù ahụ maka mbọ dị iche iche ha na-agba n’ịkwalite ezi ọnọdụ ahụike ụmụ mmadụ, ọ kachasị ndị nọ n’ime ime obodo, ma kwe nkwà na ọchịchị ya ga-aga n’ihu n’inye ha nkwàdo na ịdọnyere ha ukwu, dịka ha si ákwàdó ụlọ ọrụ na otu ọbụla na-agba mbọ ịkwàlite ọdịmma ụmụ mmadụ. O kwuru na ọchịchị nọ ugbu a na steeti ahụ ga-aga n’ihu n’inye ụmụafọ s