Posts

Showing posts with the label nchekwa ozu

Anambra ga-amalite ụlọakwụkwọ ọzụzụ maka nchekwa ozu

KỌMISHỌNA na-ahụ maka ahụike na steetị Anambra bụ Joe Akabuike ekwuola na gọọmentị steetị ahụ ga-ebido ụlọakwụkwọ ebe a na-amụ maka idozi ozu ‘School of Mortuary Services’ mgbe adịghị anya. O kwuru na a ga-amalite nke a n’otu ụlọakwụkwọ ahụike na steetị ahụ. Ọ kọwara na ụlọakwụkwọ ahụ bụ ebe ndị na-alụ n’ụlọ ọba ozu ga-enweta ezigbo ihe ọmụmụ iji mata ka ha ga-esi na-ahazi ozu iji gbochie ọrịa ndị na-efe efe. Akabuike kwuru na steeti Anambra so n’otu n’ime steetị ndị hibere otu ndị na-elekọta ozu n’Africa. Dịka o siri kwuo, ọtụtụ ndị ọlụ n’ọba ozu enweghị ezigbo ọzụzụ nke bụ ihe mere gọọmentị ji gba mbọ ikuziri ha iji mee nke ọma n’ọlụ ha. Kọmishọna ahụ rutukwara aka na onweghị onye nwere ikike ili mmadụ ma ọ bụrụ na o bughị ụzọ nata ikike site n’aka dibia oyibo n’ihi na ọ bụ ha bụ ndị nwere ikike ikwu na mmadụ anwụọla. O chetakwara na mgbe ụfọdụ ka a na-ekwu na mmadụ anwụọla ma mgbe e ruru n’ọba ozu, onye ahụ ekulite. O kwuru na a kuzierela ndị na-alụ n’oba ozu na steetị Anambra ka ha