Posts

Showing posts with the label na nne ya nyere ya nsị

Nwatakiri agwala ụlọikpe ka nne ya si nye ya nsị ka o gbuo nna ya

OTU nwata nwoke gbara afọ iri agwala ụlọikpe ‘Mapo Customary Court’, Ibadan, na nne ya nyere ya nsị ka o tinyere nna ya na nri na mmiri o ji asa ahụ. Nne nwata nwoke ahụ bụ Adenike Ayodele ka e kwuru na ọ dịla na mbụ kpọkuo ụlọikpe ka e kewaa alumdi afọ iri na ise ya na di ya bụ Adeshina. Iwe ya bụ na anya erughị di ya ala, tinyekwara na ọ na-eti ya ihe mgbe nile. N’ịgba ama ya, nwa ha nwoke gwara ụlọikpe ahụ na nne ya nyere ya ngwugwu ”nylon’ nke ihe dị na ya dị ntụ ntụ ma gwa ya ka o tinye  na nri nna ya, ya na mmiri o ji asa ahụ. Ọ kwuru sị; ‘mgbe o nyechara m ihe ahụ, ọ dọrọ m aka na nti ka m ghara ịgwa nna m na onye ọ bụla banyere ya. Otu o sila dị, ahụrụ m nna m n’anya; agwara m ya maka achọghị m ka ajọ ihe ọbụna mee ya.” N’akụkụ nke ya na nzaghachi, Adeshina nabatara ka e kewaa alumdi ha mana ọ gọrọ agụgọ banyere ebubo nwunye ya boro ya nke gụnyere iti ihe, ewetaghị ego e ji azụ ụmụaka na izite ndị ohi ka ha zukọrọ ngwa ahịa ya na ọtụtụ ihe ndị ọzọ. Ọ gwara onye ọka ikpe na ya n