A Dụọla ndị nne ka ha onyesie ike n'ọlụ mmepe obodo
Izunna Okafor A dụọla ma kpọkuo ndị nne n’ụwa gbaa gburugburu ka ha cheta ọrụ ha dịka ndị mwulite na ndị nhazi ezinaụlọ, tụnye ụtụ nke ha ma sonyesiekwa ike n’ọrụ mmepe obodo. Nwunye aka na-achị steeti Anambra bụ oriakụ Eberechukwu Obianọ nyere ndụmọdụ a ma kpọọkwa oku ahụ na nnukwu mmemme ọgbakọ izugbe nke ụmụnwaanyị ụka Anglịcan na Dayọsiisi Awka, bụ nke e mere n’ụlọ ụka St. Mark dị n’Ụmụawụlụ n’okpuru ọchịchị Awka Sawụtụ na steeti ahụ. Ya, bụ nnukwu nwaanyị, nke onye nọchitere anya ya bụ nnukwu onye enyemaka pụrụ iche nye gọvanọ steeti ahụ n’ọrụ pụrụ iche, bụ Oriakụ Amaka Ezike, toro ndị chịkọbara ya bụ ọgbakọ, ma kọwaa na isonyesi ike n’ụdị ọgbakọ ahụ na ihe ndị ọzọ a na-achịkọba na steeti ahụ bụ nnọọ ezi ụzọ pụtara ihe esi anụcha ma na-eme ka ụmụnyaanyị bụrụ ndị e ji ama atụ ibi ezi ndụ n’obodo, ndị nhazi ezinaụlọ doro anya, na ndị kwụụrụ onwe ha. O kwuru na ọchịchị nọ ugbu a na steeti ahụ bụ ọchịchị nwere ezi ebumnobi banyere ụmụnwaayị, kpọpụtasịa ọtụtụ ihe dị iche iche ọchịchị