Posts

Showing posts with the label mma

MMA (Beauty)

KERE kere ka ọ na-egbu Ọbụnadị n’anya onye ìsì Onye chi ya gọzìrì O were nke ya, mebe ngàlá   Mma adịghị n’ótú Ọnịtsha Maka na ihe dị ụtọ bu ihe dị ụkọ Ọ bụ ezie na e nwere adịgbòlója Mana ihe a gba n’aka E jighi ènyò ele ya   Mma so n’ihe nwaanyị jiri ka ibe ya Ọ bụghị naanị mma ihu Ma ọ bụ ọcha ihu fanta ọkpọ kooku Kama, ezi agwa bụ mma nwaanyị   Ụmụ nwoke nwere nke ha Ọ bụghị naanị mma afọ ọnụ Kama site na mpempe akwụkwọ na-esi ajọ isi Maka na ego bụ mma nwoke Onye nwekarịa, ọ makarịa N’anya ụmụ nwaanyị Na-agbanyeghị ole afọ ọnụ ya ha   Mma bụ ego Mma bụ agwa E nwerekwara mma ihu Mma bụkwazị ihe ónwúnwé   Mma niile a dị mma Mana ihe kacha mkpà bụ Gịnị ka onye nwe ya jiri ya mepute Tupu à tụnye ihe niile ahụ n’igbé Maka na agbọghọ na-esu ùdù Oge ya ana-aga   Mma nịịle nwere ebumnobi Mma abụghịkwa ihe ngàlá Mma abụghịkwa maka ịpịa ọkụ Maka na otu ụbọchị Ihe niile ahụ ga-aba n’ajọ ọcha   Lezie anya ma hazie mma nke gị Ka i wee sòró àbàlà mụrịa amụ Maka na mma na-agafe agafe Abụkwa orec