A gwala ndị eze ka ha tinye aka n'igbochi mgbasa ọrịa korona
A KPỌKUOLA ma dụọ ndị eze ọdịnala obodo dị iche iche nasteeti Anambra ka ha gbaa mbọ hụ na a na-agbaso ma na-emezùpụta atụmatụ nchekwana ike nkwụcha maka ọrịa nje korona n’ime obodo ha dị iche iche. Ọ bụ Kọmishọna na-ahụmaka ahụike na steeti Anambra, bụ Dọkịta Vincent Ọkpala nyere ndụmọdụ a n’okwuya oge ya na ndị eze ọdịnala steeti ahụ na-enwe nzukọ n’obi gọọmeenti dịn’Awka. O kèlèrè ndị eze ọdịnalaahụ maka ụzọ dị iche iche ha sigoro tinye aka n’ọrụ n’agha ahụ a na-ebu megide ọrịkorona n’ime steeti ahụ, ma mee ka ha mara na a ka na-atụkwa anya ụfọdụ ihen’aka ha, n’ihi na ha ka nwere ọtụtụ ọrụ dịịrị ha, tụmadụ n’ebe o metụtara ịhụna ndị obodo ha dị iche iche na-erube isi nyegara iwu banyere ọrịa korona,nakwà ntụziaka niile ahụ gọọmenti na ụlọọrụ Nigeria ‘Centre for Disease Control(NCDC) nyèrè dịka ụzọ kacha mma isi belata mgbasa ọrịa ahụ. O chetaara ha nasteeti Anambra enweela ebe a na-eme nnyòcha iji chọpụta onye nwere ọrịa ahụ, bụkwaakụrụngwa o kwuru na ọ pụrụ ime nnyocha ruru p