A kpụpụla onyenkuzi ụlọikpe maka ịdakpo nwaakwụkwọ
ỤLỌIKPE, Majie (Abiokuta Magistrate Court) amalite ikpebanyere otu onyenkuzi aha ya bụ Azunyere Chima, gbara afọ iri abụọ na atọ maka ịdakpoma kwaa nwaakwụkwọ gbara afọ iri na anọ iko n’ike. Dịka a nọ n’ikpe,Majie I.O Abudu nabatara ka a tọhapụgodu ya bụ onyenkuzi (bail); mana ọ ga-akwụpuku narị naịra ise (N500,000) ma kpọtakwa mmadụ abụọ ọnụ ruru n’okwu n’ụdị egoahụkwa, bụ ndị ga-anapụ ya n’aka ebe (sureties). Ọ gara n’ihu kwuo nammadụ abụọ ahụ ga-enwe ala nke dị n’okirikiri (jurisdiction) ụlọikpe ahụ magosikwa ihe zipụtara na ha na-atụ ụtụ isi takịsị afọ abụọ bụ nke ga-agụnye afọa bụ 2020. Abudu kwuru na ya bụnwoke kpara arụ ahụ ka ga-anogodu n’ụlọnga nke dị n’Ibara (correctional centre)ma ọ bụrụ na o nwetaghị ihe ndị ahụ a gwara ya, ma yigharịa ikpe ka ọ dịbaziema ọnwa Septemba dị n’abalị iri na otu. Onye uweojii okwu dịn’aka (prosecutor) Maazị Adekunle Opayemi gwara ụlọikpe ahụ nan woke ahụ kparaya bụ arụ ka ọnwa Maachị dị n’abalị iri abụọ n’ihe dịka elekere ise nke mgbede.