Posts

Showing posts with the label ji ọhụrụ

Mmanwụ ekpoo elu dịka onyeisi ASATU riri ji ọhụrụ

Image
A KỌWAALA mmemme iri ji ọhụrụ dịka otu n’ime omenala pụrụ iche e jiri mara ndị Igbo, nà omenala ha mebere kemgbe mgbe gboo.   Onyeisi òtù jikọtara ndịisi ọchịchị obodo dị icheiche dị n’Anambra, bụ ‘Anambra State Association of Town Union (ASATU)’ Maazị Titus Akpudo bụ ya kwupụtara nke a na mmemme iri ji ọhụrụ nke ahọ 2022 o mere be ya n’obodo ya bụ Eziowelle, n’okpuruọchịchị ime obodo Idemili North nke steeti Anambra.   Maazị Akpudo, onye bụkwa onyeisi ọchịchị obodo (PG) Eziowelle merùbèrè ya bụ emume iri ji ọhụrụ oge eze ọdịnala obodo ahụ bụ Igwe Okonkwo Etusi mèchàrà omenala Ịwa Ji obodo ahụ   Ya bụ mmemme bụkwa nke dọtara ọtụtụ ụmụafọ Eziowelle, ndịisi ọchịchị obodo dị icheiche dịgasị n’Anambra, ndị ọrụ gọọmenti, ndị e ji okwu ha agba izu na ngalaba dị icheiche, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ sitere ebe dị icheiche wee bịa.   N’okwu ya na mmemme ahụ, Maazị Akpudo, onye eze ọdịnala obodo ahụ chiri echichi na nsonso a dịka “Ugwu Nyịrị Onye Ọsọ” mèrè ka a mara na mmemme iri ji ọhụrụ bụ nnukwu m

Alor eriela ji ọhụrụ

Image
A KỌWAALA n’ebe o doro anya na mmemme iri ji ọhụrụ n’ala Igbo abụghị ikpere arụsị, dịka ụfọdụ si eche.   Eze ọdịnala obodo Alor dị n’okpuruọchịchị ime obodo Idemili nke steeti Anambra, bụ Igwe Chinedu Elibe Okonkwo (Ezediohamma nke atọ) kwupụtara nke a na mmemme iri ji ọhụrụ obodo ahụ nke ahọ 2022.   Ya bụ mmemme bụ nke weere ọnọdụ n’obi eze ọdịnala obodo ahụ, ma bụrụkwa nke dọtara ụmụafọ Alor na ọtụtụ ndị ọzọ sitere ebe dị icheiche wee bịa.   Igwe Okonkwo, oge ọ na-awa ji kpọmkwem na mmemme ahụ, mèrè ka a mara na mmemme iri ji ọhụrụ bụ nnukwu mmemme n’ala Igbo, ma bụrụkwa mmemme e ji akwanyere ji ùgwù dịka eze ihe a kọrọ n’ugbo, dịka omenala Igbo siri dị.   O kwuru na ọ bụ nke adabàghị adaba chaachaa, bụ echiche ahụ ụfọdụ ndị mmadụ na-eche na ihe ụfọdụ na-ekwu oge ụfọdụ na iri ji ọhụrụ bụ ihe ikpere arụsị maọbụ ihe ọgọ mmụọ, ọbụladị dịka ọ dụrụ ndị na-eche ụdị echiche dị etu ahụ ka ha kwụsị ya, n’ihi na o nweghị ihe ọbụla jikọọrọ iri ji ọhụrụ na ikpere arụsị, maọbụ nwee ka ha abụọ si

Ụmụawụlụ eriela ji ọhụrụ

A KỌWAALA n’ebe o doro anya na mmemme iri ji ọhụrụ n’ala Igbo abụghị ikpere arụsị dịka ụfọdụ si eche.   Eze ọdịnala obodo Ụmụawụlụ dị n’okpuru ọchịchị ime obodo ‘Awka South’ nke steeti Anambra, bụ Igwe Joel Egwuonwu kwupụtara nke a na mmemme iri ji ọhụrụ obodo ahụ nke ahọ 2021.   Ya bụ mmemme dọtara ụmụafọ obodo ahụ sitere ebe dị icheiche wee bịa, ma bụrụkwa nke a nọrọ n’obi eze ọdịnala ahụ wee mee.   Igwe Egwuọnwụ, oge ọ na-awa ji kpọmkwem na mmemme ahụ, mere ka a mara na mmemme iri ji ọhụrụ bụ nnukwu mmemme n’ala Igbo, ma bụrụkwa mmemme e ji akwanyere ji ùgwù dịka eze ihe a kọrọ n’ugbo, dịka omenala Igbo siri dị.   O kwuru na ọ bụ nke adabàghị adaba chaachaa, bụ echiche ahụ ụfọdụ ndị mmadụ na-eche na ihe ụfọdụ na-ekwu oge ụfọdụ na iri ji ọhụrụ bụ ihe ikpere arụsị maọbụ ihe ọgọ mmụọ, ọbụladị dịka ọ dụrụ ndị na-eche ụdị echiche dị etu ahụ ka ha kwụsị ya, n’ihi na o nweghị ihe ọbụla jikọọrọ iri ji ọhụrụ na ikpere arụsị, maọbụ nwee ka ha abụọ si bụrụ otu ihe.   O kelere Chineke maka iche

Ndị Enugwu-Agidi ewerela ọñụ rie ji ọhụrụ

DỊKA oriri ana eri kwa afọ na mpaghara ala Igbo niile iji na- akwalite omenaala Igbo, udo na ọṅụ nke obodo, mmemme iri Ji ọhụrụ bụ otu ụzọ n’ime oriri ejiri mara ndi Igbo.   Mmemme a bụ nnọọ nke emere n’ụdị pụrụ iche na obodo Enugwu-Agidi nke dị n’okpuru ọchịchị Njikoka, oge Eze ọdịnala na-achị obodo ahụ bụ Igwe Izuchukwu Daniel Okekeonyeocha, Igwe Ezinato mere mmemme Awam Ji Ọhụrụ nke afọ a na obi ya.   Nke a mere ụzụ mmadụ ji were tụọ na be Igwe oge ahụ. Mmanwụ di iche iche dịka Ajọfịa, Ijere na ndi ọzọ gbarakwara. Otu di iche iche nke gunyere nwoke na nwaanyị nakwaazị  ụmụaka bịara ya bụ mmemme. Ha nyerekwara Igwe Ezinatọ onyinye di iche iche.   N’okwu ya oge ọ na awa Ji, Igwe Okekeonyeocha kelere Chineke maka ọrụ ugbo na owuwe ihe ubi nke afọ a, ma bụrụ nke o kwuru na ọ bụ ọpụrụ iche.   Ọ kọwara na mmemme ahụ bụ nnọọ nke marltere n’oge gboo ma bụrụ nke a na-eme na-emesịa Ifejiọkụ tupu ezinụlọ ọbụla amarlte iri Ji ọhụrụ ma gaa n’ihu kwue na ọ bụ “Otite Nze” n’asụsụ obodo ha. Ọ rịọkw

Ndị Abacha eriela ji ọhụrụ

Ọ KPỌTỤRỤ akpọtụ ma zụọ azụọ na nsonso a dịka eze ọdịnala na ụmụafọ obodo Abacha dị n’okpuru ọchịchị ime obodo ‘Idemili North’ nke steeti Anambra mere mmemme iri ji ọhụrụ ha nke ahọ 2021.   Oke mmemme  Ịwa Ji ahụ bụ nke weere ọnọdụ n’obi eze ọdịnala obodo ahụ, bụ Igwe Godwin Nwabunwanne Odiegwu, ma bụrụkwa mmemme ịwa ji nke mbụ ọ na-eme dịka eze ọdịnala, n’ihi na ọ bụ n’abalị asaa nke ọnwa Jenụwarị nke ahọ a ka e chiri ya Igwe obodo ahụ.   Mmemme iri ji ọhụrụ ahụ dọtàkwàrà ọtụtụ ụmụafọ steeti ahụ, ndị ọrụ gọọmenti, ndị di iche iche e ji okwu ha agba ìzù, ndị enyi na ndị nwadiala, bụ ndị sitere mpaghara ebe dị iche iche n’obodo ahụ nà mpụga ya wee bịa isoro obodo ahụ ñụrịa.   N’okwu ya oge ọ na-eme omenala ịwa ji kpọnkwem na mmemme ahụ, Igwe Odiegwu kọwàrà iri ji ọhụrụ dịka emume pụrụ iche n’ala Igbo e ji akwanyere ji ùgwù ma na-enyekwa Chineke ekele maka ọkụkọ ugbo na owuwe ihe ubi.   O kelere Chineke maka onyinye ndụ na nchekwa ya n’isi ụmụafọ obodo ahụ, ma ndị nọ n’ụlọ ma ndị nọ n’ụz

Emume iri ji ọhụrụ n’omenala Igbo

IRIji ọhụrụ abụghịzị okwu ọhụụ na ntị nwa ọbụla gbara ahọn’ala Igbo. Ka ọ dị taa, ọtụtụ ndị na-enye ya nkwọwa dị iche-iche ma na-ahụtakwaya dịka nke ma ọ bụ nke ọzọ.   Kaosiladị, Igbo sịna-abụ e gburìsie anụ enyi, o kwere obubu, maka na ọ bụrụ na ọkpụ aja akọwaghịihe ọ kpụrụ, òfèkè nwere ike ịkpọ nwansu amụ dike. Ọ bụ nke mere o jiri dị mkpaịkọwa ihe ‘Iri Ji Ọhụụ’ bụ n’ala Igbo, ọkachasị dịka otu n’ime omenala e jirimara ha.   Igbo sị na ihe suru,à gbabá ya, ọ bụghị egwu, ọ bụrụ ọsọ.   N’ịgbasò nke ahụ,iri ji ọhụụ bụ otu n’ime omenala dị iche iche e ji mara ndị Igbo n’ụwa gbaagburugburu. Ọ bụ mmemme omenahọ ma bụrụkwa nke ezi nwaafọ Igbo ọbụlana-esonyesi ike na ya.   Mmemme iri ji ọhụụ bụoge e ji enye Chineke ekele n’ihi onyinye ji, ya na nchebe ya na ndụ o nyereanyị wee ruo n’oge owuwe ihe ubi; maka na ọ na-abụ a kọọ, gwute, a sị na ahọamagbuo onwe ya. Ọ bụkwa oge a ka ndị Igbo ji akwanyere ji ugwu ruuru ya dịkaeze nke ihe niile a kọrọ n’ubi, dịka akụkọ okike siri kọọ, bụkwa nke mere

Ndị Obosi ewerela ọñụ rie ji ọhụrụ

ỊMA mma nke ọnatarachi na omenala ndị Igbo pụtàkwàrà ihe ọzọna nsonso a dịka ndị obodo Obosi merùbèrè mmemme iri ji ọhụụ ha nke ahọ 2020.   Ya bụ mmemme bụ nkeweere ọnọdụ n’òbí eze ọdịnala obodo ahụ dị n’okpuru ọchịchị Idemili Nọọtụ nke steetiAnambra, ma bụrụkwa nke ụmụafọ obodo ahụ na ndị dị iche iche e ji okwu ha agbaìzu sonyere na ya.   N’okwu ya oge ọna-awa ji na mmemme ahụ, eze ọdịnala obodo ahụ bụ Igwe Chidubem Iweka fọrọekele n’ụkpa wee bunye Ekè kere ụwa maka bụ Chineke maka ọrụ ugbo na owuwe iheubi nke ahọ a, bụ nke o kwuru na ọ pụrụ iche na nke ahọ ndị gara aga. Okelekwara Chineke maka udo na ngọzị Ya n’isi obodo ahụ na ụmụafọ ya nọgasị ebedị iche iche agbara onwe ha mbọ, ma rịọ ka ọ gaa n’ihu ime ka udo Ya na-achịn’obodo ahụ ma na-awụkwasa ngọzị Ya n’isi ụmụafọ steeti ahụ.   Igwe Iweka mere ka amara na ọ bụ n’Afor Adike ka ha gaara anọ mee mmemme ahụ, mana ha achọghị imeya bụ mmemme n’ụzọ ọ ga-ekwo ekwò nke ukwuu n’ihi ọrịa nje korona na-ebi ụwaaka ọjọọ n’ụzọ dị iche iche ug

Ndị Nawgu eriela ji ọhụrụ

Ọ KPỌTỤRỤ akpọtụ ma zụọ azụọ na nsonso a, dịka ndị obodoNawgụ merùbèrè mmemme iri ji ọhụụ ha nke ahọ a bụ 2020.   Na nkenke okwuchukwuya na mmemme ahụ, bụ nke a malitere site n’ịkà ụka obere oge, Ụkọchukwu EugeneAnowai mere ka a mara na ha na-akwanyere ji ùgwù dịka onyinye pụrụ iche sin’aka Chineke wee bịara mmadụ. Ọ kpọkuzịkwara ma kelee Chineke maka ezi ọrụ yan’obodo ahụ, ọbụnadị dịka o kpere ekpere wee kpọkwàsị ngọzị Chineke n’isi ụmụafọobodo ahụ, ma ọnọ n’ụlọ, ma ọnọ n’ụzọ ijè.   N’okwu nke ya oge ọna-awa ji n’óké mmemme iri ji ọhụụ ahụ, bụ nke weere ọnọdụ na Nawgụ dị n’okpuruọchịchị Dunukọfịa nke steeti Anambra, eze ọdịnala obodo ahụ, bụ Igwe IgweGeorge Okaa-Onwuogu kèlèrè Chineke maka ichekwaba ụmụafọ obodo ahụ malite n’ogeịkọ ọrụ ugbo wee ruo ugbua bụ oge owuwe ihe ubì.   O kpekwaara Chinekemaka ngọzị Ya n’isi ụmụafọ obodo Nawgụ nọ ebe dị iche iche ma kelekwa Ya n’ihiudo na-achị n’obodo ahụ, ma rịọ Ya ka ọ gaa n’ihu ichekwaba na ịgọzi ya bụobodo. Ọ gara n’ihu mee ka a mara na ir

Otu Keep Fit Sports Club, Awka emeela ịwa ji nke afọ 2020

… Mee mmadụ anọ ndị ọzọ nkwado omehala I JI gosi mkpa ọ dị ikwalite omenala Igbo, Keep Fit SportsClub bụ otu jikọrọ nwoke na nwaanyị ndị nwere mmasị n’ihe gbasaara mmegharị ahụmaka nkwalite ahụ ike emeela mmemme ịwa ji nke afọ a bụ nke achịkọbara n’ụlọihe mmemme (Event Center) dị n’ogige ụlọọrụ Anambra Newspapers and PrintingCorporation, Awka.   Otu ahụ malitere mmemmeịwa jị a bụ nke ha na-eme kwa afọ site n’ịmegharị ahụ dịka ha si eme ya kwa izụụkaọbụla. N’okwu mmalite ya, onyeisi otu ahụ ma bụrụkwa onyeisi n’ụlọọrụAnambra Newspapers and Printing Corporation bụ Maazị Chuka Nnabuife kọwara otuKeep Fit Sports Club dịka otu na-emesi ihe ike. O kwuru na ya bụ otu na-agbakọbana ama egwuregwu Alex Ekwueme dị n’Awka kwa ụbọchị Satọde, Wenezide nakwa ụbọchịezumike (public holiday) ọbụla, ma rịọ ka onye ọbụla nwere mmasị na ihe gbasaraegwuregwu mmegharị ahụ bịa ma debanye aha ya ma sonyere ha n’otu ahụ. Ọ gakwazịrị na ihụ kọwaa na mmemme iri ji ọhụụ bụ ihe hana-eme kwa afọ ọbụla ma bụrụ nke n

Ndị Ihiala ejiri ọñụ rie ji ọhụrụ afọ 2020

Image
OKE ọñụ dara na nsonso a n’obodo Ihiala dị n’okpuru ọchịchịsteeti Anambra, dịka ndị obodo ahụ merùbèrè mmemme iri ji ọhụụ ha nke ahọ 2020.   Mmemme Ịwa Ji ahụ emere n’obi eze ọdịnala obodo ahụ bụ Igwe Thomas Ikenna Obidiegwu dọtàrà ụmụafọobodo ahụ nọgasị n’ebe dị iche iche, ndị ikwu na ibe, ndị nwadiala, ndị enyi,ndị agbatobi na ndị ọzọ na-echère obodo ahụ ezi echichè.   N’okwu ya oge ọna-agọ ọjị na mmemme ịwa ji ahụ, Igwe Obidiegwu kelere Chineke maka ọrụ ọma yan’isi ụmụafọ obodo ahụ, ọkachasị n’ihi ndụ, ngọzị, udo na ọganihu nke o jiri chọọha mma, ya na amara o nyere ha, ha wee kọọ ihe n’ubi ma dịkwa ndụ weta ihe ha kọnyèrèn’ubì.   O kelekwara akana-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ, maka ụzọ dị iche iche o sigoronwògharịa ngalaba niile nke steeti ahụ, ọkachasị ngalaba ọrụ ugbo; etu o sirikwàlite ọnọdụ obibi ndụ ụmụafọ steeti ahụ, ma wetekwa ọnọdụ mmepe tọrọ atọn’ime-ime obodo dị iche iche na steeti ahụ.   O kwezịrị nkwà na NdịIhiala ga-aga n’ihu ịkwadò ọchịchị nọ ugbua na

Ndị Owerre-Ezukala eriela ji ọhụrụ

JI bụ ézè ihe a kọrọ n’ubì, bụzị nke mere ndị Igbo n’ụwagbaa gburugburu ji akwanyere ya ùgwù.   Ọ bụ n’ịgbaso ya bụomenala dịbara gboo ka ndị obodo Owerre-Ezukala jiri nọrọ na nsonso a weemerùbe mmemme iri ji ọhụụ nke ha, nke ahọ 2020.   Ya bụ oke mmemmewèèrè ọnọdụ n’eze ọdịnala obodo ahụ, bụ Igwe Timothy Ogbonnaya dị n’IshishiOwerre-Ezukala n’okpuru ọchịchị ‘Orumba South’ nke steeti Anambra, ma bụrụkwanke dọtara ndị eze ọdịnala obodo dị iche iche, ndịisi ụka, imirikiti ndị e jiokwu ha agba izu.   N’okwu ya oge ọna-eme omenala ịwa ji ahụ kpọmkwem, Igwe Ogbonnaya kpere ekpere maka udo na ọganihun’isi obodo ahụ, steeti Anambra, ụmụ Igbo, na ala Nigeria n’izugbe, ọbụnadị dịkao kèlèrè Chineke maka ogologo ndụ na ahụike ọ na-enye. Ọ kpọpụtasịrị úrù dịiche iche omenala iri ji ọhụụ na-eweta n’obodo, ma kpọkuo ndị Igbo ka hajigidesie omenala ha ike, maka na ọ bụ ebe onye bì ka ọ na-awàchi.   O jikwara ohèrè ahụwee kelee aka na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obianọ maka ọrụ ọma na ọrụmmep

Mmemme iri ji ọhụrụ bụ nnukwu omenala Igbo

IRI ji ọhụụ abụghịzị okwu ọhụụ na ntị nwa ọbụla gbara ahọn’ala Igbo. Ka ọ dị taa, ọtụtụ ndị na-enye ya nkwọwa dị iche-iche ma na-ahụtakwaya dịka nke ma ọ bụ nke ọzọ.   Kaosiladị, Igbo sịna-abụ e gburìsie anụ enyi, o kwere obubu, maka na ọ bụrụ na ọkpụ aja akọwaghịihe ọ kpụrụ, òfèkè nwere ike ịkpọ nwansu amụ dike. Ọ bụ nke mere o jiri dị mkpaịkọwa ihe ‘Iri Ji Ọhụụ’ bụ n’ala Igbo, ọkachasị dịka otu n’ime omenala e jirimara ha.   Igbo sị na ihe suru,à gbabá ya, ọ bụghị egwu, ọ bụrụ ọsọ.   N’ịgbasò nke ahụ,iri ji ọhụụ bụ otu n’ime omenala dị iche iche e ji mara ndị Igbo n’ụwa gbaagburugburu. Ọ bụ mmemme omenahọ ma bụrụkwa nke ezi nwaafọ Igbo ọbụlana-esonyesi ike na ya.   Mmemme iri ji ọhụụ bụoge e ji enye Chineke ekele n’ihi onyinye ji, ya na nchebe ya na ndụ o nyereanyị wee ruo n’oge owuwe ihe ubi; maka na ọ na-abụ a kọọ, gwute, a sị na ahọamagbuo onwe ya. Ọ bụkwa oge a ka ndị Igbo ji akwanyere ji ugwu ruuru ya dịkaeze nke ihe niile a kọrọ n’ubi, dịka akụkọ okike siri kọọ, bụkwa nke mere

Ndị Nanka eriela ji ọhụrụ

OKE ọñụ dara nnọọ n’obodo Nanka dị n’okpuru ọchịchị imeobodo Orumba North nke steeti Anambra, dịka ndị obodo ahụ merubèrè mmemme iriji ọhụrụ ha nke ahọ 2020. Ya bụ mmemme iri ji ọhụrụ  bụ nke weere ọnọdụ n’obi eze ọdịnala obodo ahụ,bụ Igwe Ogochukwu Ezeilo ma bụrụkwa nke ọtụtụ ụmụafọ obodo ahụ na ndị sitereebe dị iche iche sonyere na ya.   N’okwu ya oge ọna-awa ji kpọmkwem, Igwe Ezeilo kọwara iri ji ọhụrụ dịka otu n’ime mmemme pụrụiche e jiri mara ndị Igbo, n’ihi na  ọ bụghịnaanị na ọ bụ omenala kara aka ndị Igbo na-eme kwà ahọ ọbụla, kama na ọ bụkwaoge na mmemme e ji ekele Chineke maka ndụ, nchekwa na ngọzị, kpaa maka ọganihuobodo, kwanyere ji ùgwù dịka eze ihe a kọrọ n’ubì, ma gosipụta, kwalitekwa ịmamma nke ọnatarachi na omenala ndị Igbo.   Dịka ọ na-akọwa nanke ahụ bụ nke ugboro anọ ọ na-awa ji dịka eze ọdịnala obodo Nanka, o kelereChineke maka ezi ngọzị ya n’isi ụmụafọ obodo ahụ, ya na ọganihu na udo dịn’obodo ahụ ugbua.   Igwe Ezeilo gakwaran’ihu fọọ ekele n’ụkpa wee bunye aka na

Achalla ewere ọñụ rie ji ọhụrụ

IGBO sị na ọ na-abụ mgbe onye jiri teta, ọ bụrụ ụtụtụ ya, ma sịkwa na Ka ọ dị taa, ọ kpọtụrụ akpọtụ ma zụọ azụọ n’Achalla bụ isi obodo okpuru ọchịchị ‘Awka North’ nke steeti Anambra na nso-nso a, dịka ya bụ obodo merubèrè mmemme iri ji ọhụụ ya nke ahọ 2019. Oke mmemme ahụ bụ nke weere ọnọdụ n’obi eze ọdịnala obodo ahụ, bụ Igwe Alex Nwokedị, ma bụrụkwa nke dọtara imirikiti ụmụafọ obodo ahụ nakwa ọtụtụ ndị ọzọ ọnụ na-eru n’okwu, sitere mpaghara ebe dị iche iche na steeti ahụ wee bịa iji anya ha gbaa ekeresimeesi na ya bụ emume. N’okwu ya oge ọ na-agọ ọjị na mmemme ahụ, Igwe Nwokedị bunyere Eke kere ụwa ụkpa ekele maka onyinye ndụ, nchekwaba na odudu Ya n’isi ụmụafọ obodo ahụ, steeti Anambra, na ala Nigeria n’izugbe; ma tòkwa ya maka ime ka ha dịrị ndụ kọọ ma wekwa ihe ubi n’ụba n’ahọ a. Ka ọ na-etòkwa ụmụafọ obodo ahụ na aka na-achị steeti ahụ bụ Gọvanọ Willie Obianọ maka ezi ọrụ mmepe na-aga n’ihu n’obodo Achalla; ya bụ eze ọdịnala kpekwazịrị ka Chineke gaa n’ihu ime ka udo tọrọ àtọ, ah

Otu Ogboada eriela ji ọhụrụ, mechie afọ n’añụrị

ỤBỌCHỊ bụ nnọọ sọ ọñụ dịka òtù a kpọrọ ‘Ogboada Welfare Association’ jiri obi ụtọ wee merùbe mmemme iri ji ọhụrụ ha nke afọ 2018, wee mechikwa afọ n’ótù. Ya bụ oke mmemme bụ nke weere ọnọdụ n’Awka bụ isi obodo steeti Anambra ma bụrụkwa nke dọtara imirikiti ndị òtù ahụ, ndị enyi ha, ndị ezinaụlọ ha na ndị na-echere ha ezi echiche. Na nkuzi pụrụ iche o nyere na ya bụ ọgbakọ, Ọkammụta Gọdwin Onyekaọnwụ kọwara ji dịka nnukwu ihe nakwa nri pụrụ iche na-ejikọta obodo ọnụ ma wetekwa udo. O mere ka a mara na ji bụ eze ihe a kụrụ n’ubi nakwa nri a na-akwanyere ugwu pụrụ iche n’ala Igbo, ma sị na mmemme iri ji ọhụụ bụ oge iji nye Chukwu Abịama òtùtó maka ònyìnye ndụ, ọganihu na ahụ isi ike. N’okwu nke ya dịka ọ na-awa ji ọhụụ ahụ a hụrụ ahụ, onye nọ dịka nnukwu nna nyere ndị òtù ahụ, bụ Dọkịta Ernest Ifebi, tòrò Chineke  maka ndụ na ahụike nke o jiri chọọ ndị òtu ahụ mma ma kpekwa ekpere maka ogologo ndụ na udo. N’okwu nke ya, onye na-anọchite anya ọgbọ nta nkwàdo Anambra etiti n’ụlọ ọgbakọ sine

Ndị Ebenatọ eriela ji ọhụrụ

Rịọ enyemaka gọọmenti maka mbize ha Izunna Okafor Ọ BỤ nnọọ ụwa bịa kirie ụbọchị Tuzdee gara aga, dịka ndị obodo Ebenatọ dị n’okpuru ọchịchị Nnewi South nke steeti Anambra mere mmemme iri ji ọhụụ ha nke ahọ 2018. Ya bụ mmemme bụ nke weere ọnọdụ n’obi eze ọdịnala obodo ahụ dị n’Ụmụnnama Ebenatọ, ma bụrụkwa nke dọtara ọtụtụ ndị mmadụ sitere n’ime obodo ahụ na mpụga ya. N’okwu ya n’oke mmemee ịwa ji ahụ, eze ọdịnala obodo ahụ, bụ Igwe Edwin Chinaewubeze Ezejiburu (Obi nke mbụ n’Ebenatọ), kọwara iri ji ọhụụ dịka otu n’ime mmemme pụrụ iche e jiri mara Igbo niile nakwa dịka ihe mbụ a na-eme n’obodo tupuu ndị obodo ahụ amalite iri ji ọhụụ n’ezinaụlọ ha dị iche iche. O toro Chineke onye mere ka ha dị ndụ wee gwuputa ji ha tinyere n’ala, ma kpekwazie ekpere maka ogologo ndụ, ahụ isi ike na ọganihu nke ụmụafọ obodo ahụ, ndị Igbo na ala Nigeria n’izùgbe. N’ajụjụ ọnụ a gbara ya na mmemme ahụ, otu nwa amadi na-esonyesi ike n’ihe a na-eme n’obodo ahụ ma bụrụkwa onye e chiri echichi dịka Ọnwa Ebenat

Aguluezechukwu eriela ji ọhụrụ

Chinwendu Uzoatu   DỊKA a nọ n’emume iri ji ọhụrụ ugbua, ndị Aguluezechukwu, nke dị n’okpuru ọchịchị Aguata na steeti Anambra nọ na Satọdee gara aga mee emume iri ji ọhụrụ. Nkea kpọlọtara ndị Aguluezechukwu nile ụlọ ka ha zukoo wee rie ji ọhụrụ dịka ụmụnne. Igwe Aguluezechukwu bụ Igwe Felix Ebelendu, kelere Chineke ma gozie ndị obodo ahụ nile. Ọ gọrọ ọfọ sị ka ọ dịrị ha na mma ma gọtakwara ndị obodo ya ndụ, nka na uju amara. Ka Igwe gọchara ọfọ, ọ wara ji, ebe ndị mmadụ ji ọñụ, itu ụzụ na ịkụ aka wee na-añụrị. ‘President General’ otu Iganihu Aguluezechukwu bụ Ifedi Okoye, ji ịhụnanya na obioma wee nabata ọha na eze, ndị gụnyere ndị obodo ahụ na ndị si mba ndị ọzọ dị iche iche wee bịa. Otu onye so na ndị e ji okwu ha agba izu n’Aguluezechukwu bụ Nze Godwin Ezeuko  kwuru sị, “obi juputara m n’ọñụ n’ihi iri ji nke afọ a. A na m ekwu sị na nke afọ ọzọ, 2019, ga-aka nke afọ a mma. Ihe dịrị onye ọbụna mma. Ka Chukwu gozie mmadu nile.” Ndị mmadụ bupụtachara ji ha kọrọ bụ ndị buru nnukwu ibu k

Nanka e riela ji ọhụrụ

Chris Anyichie   IHE mmemme iri ji ọhụụ nke ndị Nanka n’okpuru ọchịchị Orumba ‘North’ nke Anambara Steeti ka e mere n’izu ụka gara aga n’Obi Igwe Godwin dị na Nanka. Ihe mmemme a dotara ọtụtụ igwe ndị ọzọ, ndị na-akwado omenala,ndị ọlụ gọọmentị,ndị isi ụlọ ọlụ dị iche iche,ndị ụka,ndị echichi na otụtụ mmadụ. Na mmemme a, lgwe Ezeilo kpọkuru ndị gọọmentị n’ogogo ọbụla ka ha na etinye uchu n’ọlụ ugbo ka e nwee ike hụ na nri dị na ala anyi.Igwe Ezeilo gwara ndị ntorobịa ka ha makụọ ọlụ ugbo ka ha wee nwee ike kwudo n’onwe ha. Ọ kenekwara Gọvanọ Willie Obiano maka mbọ nile ọ na-agba maka itụghari ọnọdụ ọlụ ugbo n’ebe ọ dị ukwuu. Ọ kpọrọ ndi Igbo ka ha si na omume nwere ike ighasa omenaala ha pụọ, kọwaa na omenaala bụ etu ndị si ebi ndụ. Na mbụ n’okwuchukwu n’ụka e ji malite mmemme a, ‘Rev Fr’.Christian Umeojilinnaka bụ ụkọchukwu n’elekota ụlọụka”Saint Anthony’s Catholic Church,’Nanka, kọwara mmemme iri ji ọhụụ dịka ohere ndị mmadụ ji e gosi chineke obi aṅụri maka nnukwu owuwe ihe ubi o nye

Ndị Ihiala ewerela ọñụ rie ji ọhụrụ

IGBO sị na omenala bụ ọbara na-ehù na ndụ àgbụrụ, ma sịkwa na ọ na-abụ a kọọ, gwute, a sị na ahọ amagbuola onwe ya. N’ịgbaso nke a, ọ kpọtụrụ akpọtụ ma zụọ azụọ na nso-nso a, dịka ndị obodo Ihiala dị n’okpuru ọchịchị Ihiala na steeti Anambra mere mmemme iri ji ọhụrụ ha, ya na mmemme Ịgba Ọfala nke eze ọdịnala obodo ahụ.   Mmemme ahụ bụ nke a nọrọ na ya wee chibesie ma nyekwa ụfọdụ ụmụafọ obodo ahụ mepụtàgòrò ihe dara ụdà echichi na nkwanye ùgwù, ma bụrụkwa oke mmemme dọtara ndị selitere isi na ngalaba dị iche iche, nke gụnyere ndị ọrụ gọọmenti, ndị e ji okwu ha agba ìzù na steeti ahụ, ndị enyị, ikwu na ibe, ndị ọgọ, ndị nwadiala na ndị ọzọ na-echere ha ezi echichè, bụ ndị bịara ịnọnyere ha na isoro ha nwee ya bụ obi añụrị.   Dịka ọ na-agọ ọjị na ya bụ mmemme, eze ọdịnala Ihiala, bụ Igwe Thomas Obidịegwu, onye weliiri Olisa kere ụwa aka elu, kèlèrè Ya n’ihi onyinye ndụ, nchekwa, ihe akụakụ na ihe enweenwe, ya na ọganihu na udo tọrọ àtọ o jiri gọzie obodo ahụ na ụmụafọ ya, ma ndị nọ n’ụl