Posts

Showing posts with the label izuụka dị asọ

COVID 19: Ndị ụka ga-anọzi n'ụlọ mee emume izuụka dị asọ n’Isita

ỌKAMMỤTA, olee ihe I chere kpatara akụkọ ọjọọ ụfọdụ a na-anụgbasara ụmụ na-eto eto ugbu a; ọ kachasị ndị nọ n’ụlọ akwụkwọ di elu?   Ọtụtụ nne na nnaanaghị eleru ụmụ ha anya, ọ bụ ya bụ ihe kpatara ihe niile. Nne na nna anaghịazụzi ụmụ ha n’egwu nke Chukwu. Ha na-ahapụ ụmụ ha, ha a na-eme ihe masịrị ha.Ha anaghị eje ozi ọ bụla. Ha anaghị azacha ụlọ nke ha ji atụụtaazịza. Mgbe anyị pere mpe, ọ na-abụ n’elekere anọ nke ụzọ ụtụtụ anyị agaa chutemmiri, anyị lọta anyị azachaa ụlọ, kwado gbara ọsọ gaba akwụkwọ. Anyị na-eru n’ụlọakwụkwọ tupu elekere asatọ, mana taa ụmụaka na-anọ n’ụlọ elekere asatọ a kụọgafee, ha agaghị emegharị ahụ ịga akwụkwọ. O nwekweghị ihe ha na-eme. emegharị ahụ ịga akwụkwọ. O nwekweghị ihe ha na-eme.   Ha pụzie baa nnukwu ụlọakwụkwọ ha hụ ndị ọ dị ka ọ dị ha; ha e bido mebe mpụ. Nke mbụ bụ na ike agaghịadị ha ịgụ akwụkwọ mana ha ga-achọ ka ha gafee n’ule. Ha amaghị na ọkụkọ sị naa kụghị akụ eri na-agha afọ; ihe ha ga-emezi bụ ha abaa otu nzuzo (secret cult) were na-eme

Emume izuụka dị asọ

IZUỤKA dị asọ bụ izuụka ikpeazu n’ime lenti. Ọ bụ oge ndị otu Kristi n’ụwa niile ji eme emume dị iche iche iji nabata ‘Easter;’. Ọ bụ ụbọchị ụka gara aga ka a malitere ya site n’ịka ụka igu/ọmụ (Palm Sunday). Emume ụka igu bụ nke e ji echeta ka Jesus si gaa Jerusalem. Ọ nọ n’elu anyịnya ndị mmadụ na-atụrụ ya igu na ihe ndị ọzọ dị iche iche n’ala ma na-ebunye ya otito, na-etu ya aha dị iche iche n’ebe ọ dị ukwuu. N’ihi ya, ndị ụka dị iche iche kara ụka ebe ha nọ gọzie igu ma gagharịa, na-abụ abụ otito. Ka ụka igu gachara, a banyere n’emume ndị ọzọ na-esota ya. Ndị ụka Katolik bidoro ụnyahụ bụ Wenezdee wee mebe emume (Chrism Mass Cathedratikum) nke a na-anọ na ya gozie mmanụ e ji alụ ọlụ n’ụka dịka ichi ndị ụkọchukwu, ndị eze, ite ndị ọrịa w.d.g. Mmanụ a bụ so n’oge a ka e ji agozi ya. A na-anọkwa na ya nye Chineke onyinye ma gbukwaara ya ehi. Ọ bụ bishọọpụ na-anọ n’isi ya; a na-anọkwa na ya kelee bishọọpụ maka mbọ ya niile. Na St Patrick’s Cathedral Awka, ọ kpọtụrụ akpọtụ ụnyahụ. E ji a