NUJ amalitela izu ụka ndị nta akụkọ n'Anambra
ÒTÙ jikọtara ndị nta akụkọ n’ala Nigeria bụ ‘Nigeria Union of Journalists (NUJ)’, ngàlàba nke steeti Anambra, amalitela otu nnukwu mmemme omenafọ ha, bụ nke a kpọrọ izuụka ndị nta akụkọ. Mmemme ahụ bụ nke a malitere n’isi mbido izu ụka a site n’ofufe nro pụrụ iche e nwere n’ụlọ ụka ‘Cathederal Church of St. Faith, Awka’, ma bụrụkwa nke na-ewere ọnọdụ n’isi ụlọ ọlụ ndị otu ahụ na steeti ahụ, bụ ‘Godwin Ezemo International Press Centre’ dị n’Awka bụ isi obodo steeti Anambra. N’okwu ya dịka ọ na-agbape mmemme ahụ, aka na-achị steeti ahụ, bụ Gọvanọ Willie Obianọ, nkè onye nọchitere anya ya bụ kọmishọna steeti ahụ na-ahụ maka mgbasa ozi na ịkụziri ọhanaeze ihe ha kwèsìrì ịma, bụ C-Don Adịnụba kọwara ndị nta akụkọ dịka ndị bara oke uru na ndị nwere ọtụtụ ọlụ chere ha n’ihu n’ime ka ọnọdụ ala anyị kawanye mma. Ọ kpọkuru ndị nta akụkọ ka ha na-agbaso iwu na-achị ọlụ mgbasa ozi, kpachapụ anya n’otu ha si ebu akụkọ, ma zèéré ịgbasa ozi ụgha na ozi pụrụ iduhie ọha mmadụ, n’ihi ihe egwu dị iche i