Ịtụ ime mkpuke na nsogbu so ya
AFỌIME bụ ezi ihe ma nwanyị tụrụ ime n’ụzọ ziri ezi. Ụzọ ziri ezi bụ mgbe nwagbọhọ nwere di, baa n’ezinaụlọ nke ya. Ọ dị ime mgbe ahụ, nne, nna na ụmụnne ya añụrịa. Ndị ezinaụlọ ya a na-eme ngala na nwa ha dị ime. Nne ya a na-ejikere ịga ọmụgwọ, di ya na ndị hụrụ ya n’anya a na-agbara ya mbọ ma na-ejekwara ya ozi. Obi a na-atọ ya ụtọ na-aga amụpụta nwa. Mana ọ bụrụ na nwagbọghọ enweghị di wee dị ime, nke mbụ bụ na o weteere onwe ya aha adịghị mma. Ọzọ, ezinaụlọ ya agaghị enwe nkwuwa okwu n’ama. Ọ bụ ezie na nwa bụ ezi ihe mana ọ bụrụ na nwagbọghọ enweghị di wee dị ime, ọ dịzie ka nwa ahụ a ga-amụ ọ bu ihe ọjọọ. Ụfọdụ mmadụ anaghị eche ihe ha ga-ekwu asi na-azụghị nwagbọghọ ahụ azụ. Ụfọdụ asi na oyiri nne ya ma ọ bụ nna ya, ebe ụfọdụ ga-asị na ọ bụ nne nne ya ka o yiri. Okwu ndị a nile a na-agwa nne na nna ahụ bụ maka nzọhie ụkwụ ahụ nwagbọghọ ahụ zọhiere. Ụfọdụ ndị na-ekwugide ya mere ihe ka nke nwa ahụ mere wee dị ime ahụ, mana ha adịghi ime ma ọ bụ na ha wepụrụ nke ha. Okwe