Posts

Showing posts with the label ime mkpuke

Ịtụ ime mkpuke na nsogbu so ya

 AFỌIME bụ ezi ihe ma nwanyị tụrụ ime n’ụzọ ziri ezi. Ụzọ ziri ezi bụ mgbe nwagbọhọ nwere di, baa n’ezinaụlọ nke ya. Ọ dị ime mgbe ahụ, nne, nna na ụmụnne ya añụrịa. Ndị ezinaụlọ ya a na-eme ngala na nwa ha dị ime. Nne ya a na-ejikere ịga ọmụgwọ, di ya na ndị hụrụ ya n’anya a na-agbara ya mbọ ma na-ejekwara ya ozi. Obi a na-atọ ya ụtọ na-aga amụpụta nwa.   Mana ọ bụrụ na nwagbọghọ enweghị di wee dị ime, nke mbụ bụ na o weteere onwe ya aha adịghị mma. Ọzọ, ezinaụlọ ya agaghị enwe nkwuwa okwu n’ama.   Ọ bụ ezie na nwa bụ ezi ihe mana ọ bụrụ na nwagbọghọ enweghị di wee dị ime, ọ dịzie ka nwa ahụ a ga-amụ ọ bu ihe ọjọọ. Ụfọdụ mmadụ anaghị eche ihe ha ga-ekwu asi na-azụghị nwagbọghọ ahụ azụ. Ụfọdụ asi na oyiri nne ya ma ọ bụ nna ya, ebe ụfọdụ ga-asị na ọ bụ nne nne ya ka o yiri. Okwu ndị a nile a na-agwa nne na nna ahụ bụ maka nzọhie ụkwụ ahụ nwagbọghọ ahụ zọhiere.   Ụfọdụ ndị na-ekwugide ya mere ihe ka nke nwa ahụ mere wee dị ime ahụ, mana  ha adịghi ime ma ọ bụ na ha wepụrụ nke ha.   Okwe

Ịtụ ime mkpuke n'oge gboo na ugbu a (II)

N’OGE ugbu a, ụfọdụ ụmụnwaanyị na-ehi asaa n’anya tụrụ ime mkpuke. Ụdị ndị dị otu a, ịgaghị asị na ọ ghọrọ ha aghọ n’ihi na ha kpebiri n’ime onwe ha, tụrụ ime mụọ nwa n’ụlọ nna ha.   Ọtụtụ ihe na-akpata ya, ụfọdụ na-akọwa na ha tụrụ ime ma mụọ nwa n’ụlọ nna ha n’ihi na ha alụghị di, ya mere na ha mụrụ nwa maọbụ ụmụ ndị ahụ ka ha were nwee onye ga-ele ha nka mgbe ha ga-eme agadi.   Ndị ọzọ na-emekwa otu ahụ bụ ụmụnwaanyị lụrụ dị ma sị na be di ha laghachi be nna ha n’ihi na di ha gbara ha alụkwaghị m, maọbụ na ha onwe ha jụrụ alụmdi ahụ n’ihi nsogbu ha hụtara na be di ha. Otu nwaanyị ka di ya gbara alụkwaghị m site n’iji mmanya, tinyere omenala na-eso ya wee kpọlaa nwunye ya n’ụlọ nna ya ma bochikwaa ya ọnụ na dọkinta kwuru na akpa nwa ya emebiela n’ihi na o wepụla afọ ime (abortion) ọtụtụ ugboro.   Ka nwoke ahụ chụlachara nwunye ya, ọ gara lụrụ nwaanyị ọzọ y ana ya birizie n’obodo mepere emepe, ebe o bi. N’akụkụ nke ya, nwaanyị ahụ ọ gbara alụkwaghị m ji anya mmiri n’ihi ebubo e boro y

Ịtụ ime mkpuke: Oge gboo na ugbu a (I)

ỊTỤ ime mkpuke bụ nwaanyị ịnọ be nna ya tụọ ime n’alụghị di. Ndị Igbo na-ahụta ya dịka ihe adabaghị adaba n’ihi na omenala kwadoro na nwaanyị ga-atụ ime sọọsọ mgbe ọ lụrụ di, yaabụ ma nwoke mechaa ego n’isi ya.   N’oge gboo, a na-ahụta nwaanyị tụrụ ime mkpuke ka onye mere ihe ala na-asọ nsọ. Ụdị ọnọdụ dị otu ahụ dapụta, ọ na-abụrụ nwata nwaanyị ahụ na ezinaụlọ ya nnukwu ihe ihere. Ndị obodo na-amalite ntamu na akụkọ, onye nụ, ọ kọọrọ ibe ya. N’oge ahụ nwata nwaanyị tụụrụ ime mkpuke anaghị enwe ọnụ okwu, ọ naghị apụta iro, ọ ga na-ezogharị ka ndị mmadụ ghara ịhụ ya anya.   Ezinaụlọ nwaanyị ọbụka tụurụ ime mkpuke na-agba mbọ ijụpụta ya nwoke tụbara ya ime ka ha wee yie nwoke ahụ egwu ka ọ lụọ ya.   Dịka ndị Igbo bụ agbụrụ eji ịgụ egwu wee mara, mgbe ọ bụla a tụrụ ime mkpuke n’obodo, a na-amalite jiri aha nwaanyị ahụ gụba egwu, ma n’ụtụtụ, ehihie na abalị. Ma mgbe e ji agụkarị egwu a na-abụ oge abalị ma ọnwa na-eti. Ihe a na-akpọ ụdị egwu ahụ bụ ‘egwu ikpem maọbụ egwu nkọcha’.   Akaje ndị

Ịtụ ime mkpuke na nsogbu so ya

Uchenwa Mba dere nke a   AFỌIME bụ ezi ihe ma nwanyị tụrụ ime n’ụzọ ziri ezi. Ụzọ ziri ezi bụ mgbe nwagbọhọ nwere di, baa n’ezinaụlọ nke ya. Ọ dị ime mgbe ahụ, nne, nna na ụmụnne ya añụrịa. Ndị ezinaụlọ ya a na-eme ngala na nwa ha dị ime. Nne ya a na-ejikere ịga ọmụgwọ, di ya na ndị hụrụ ya n’anya a na-agbara ya mbọ ma na-ejekwara ya ozi. Obi a na-atọ ya ụtọ na-aga amụpụta nwa.   Mana ọ bụrụ na nwagbọghọ enweghị di wee dị ime, nke mbụ bụ na o weteere onwe ya aha adịghị mma. Ọzọ, ezinaụlọ ya agaghị enwe nkwuwa okwu n’ama. Ọ bụ ezie na nwa bụ ezi ihe mana ọ bụrụ na nwagbọghọ enweghị di wee dị ime, ọ dịzie ka nwa ahụ a ga-amụ ọ bu ihe ọjọọ. Ụfọdụ mmadụ anaghị eche ihe ha ga-ekwu asi na-azụghị nwagbọghọ ahụ azụ. Ụfọdụ asi na oyiri nne ya ma ọ bụ nna ya, ebe ụfọdụ ga-asị na ọ bụ nne nne ya ka o yiri. Okwu ndị a nile a na-agwa nne na nna ahụ bụ maka nzọhie ụkwụ ahụ nwagbọghọ ahụ zọhiere.   Ụfọdụ ndị na-ekwugide ya mere ihe ka nke nwa ahụ mere wee dị ime ahụ, mana  ha adịghi ime ma ọ bụ na ha