Posts

Showing posts with the label ikpe ọnwụ

A mala otu nwoke ikpe ọnwụ maka ịtọrọ nwata nwoke gbara afọ anọ

ỤLỌIKPE ukwu steeti Akwa Ibom, n’Ikot Ekpene amala otu nwoke aha ya bụ Ekerete Ukpong ikpe ọnwụ maka ịtọrọ nwata nwoke gbara afọ anọ aha ya bụ Success Kalu, onye nke ahụbeghị ruo taa. A mara ya bu nwoke, Ukpong gbara afọ iri atọ na otu ikpe ọnwụ n’izuuka gara aga ka a chọputarachara na ikpe mara ya. Ukpong, onye Udok Atai n’okpuru ọchịchị Ikono steeti ahụ tọọrọ Success Kalu, onye Ohafia na steeti Abia ka ọnwa Septemba dị n’abalị iri abụọ na ise, n’afọ 2015 n’Ibiakpan Akananwan dị n’okpuru ochịchị Ikot Ekpene. Onye ọkaikpe ukwu kpere ikpe ahụ bụ Justice Augustine Odokwo, kwara arịrị banyere ntọrị (kidnapping) nke na-akpa nkpankpa n’Ikot Ekpene, steeti Akwa Ibom na ala Nigeria gbaa gburugburu ma kpọọ oku ka onye ọbụla kee aji n’ume iji kpọchapụ ihe gbasara ntọri. Okaikpe ahụ gara n’ihu kwuo sin a onye ahụ kpara arụ na-anara ntaramahuhu sọọso ya onwe ya n’agbanyeghi na nnyocha mere ka a mat ana o nwere ndị ọzọ aka ha dị nay a bụ arụ, ma burụ ndị nke nọ n’oso (at large), ugbu a. O kwuru na

A mala otu pastọ ikpe ọnwụ maka igbu ọchụ

A MALA otu pastọ bi Ondo aha ya bụ Kọlawole Samson ikpe ọnwụmaka igbu Ayo Olaniyi.   Olaniyi lara mmụọ kae kwuru n ọ gara ịchụ nta mbara (frog); ya na mmadụ atọ ndị ọzọ n’ebe a na-azọazụ (fish pond) nke pastọ Kolawole nwe. A mara Kolawole ikpe n’ihi na o merụrụ Olaniyi ahụ siten’igbu ya mma n’isi, nke mere o jiri nwụọ n’ụlọọgwụ e bugara ya. Ọ bụ ụlọikpe ukwu nke steeti Ondo dị n’Akure mara PastọKolawole ikpe ọnwụ, nke Justice Ademola Bola nọ n’isi ya.   Otu o sila dị, PastọKolawole kwuru na ikpe amaghị ya.   Justice Bola kpebirina ịgbaama nke ụlọikpe ahụ nwetere gosiri na Pastọ Kolawole gburu Olaniyi.   Ọkaikpe ahụ kwubirina Samson Kolawole ga-anwụ site n’ịtụ ụdọ (hanging).

A mala otu nwaanyị ikpe ọnwụ maka ịgba nwunye di ya na ụmụ asaa ọkụ n'Ebonyi

ỤLỌIKPE ukwu steeti Ebonyi nke dị n’Abakaliki amala otu nwaanyị aha ya bụ Oriakụ Agnes Nwefuru ikpe ọnwụ. Ọ bụ na Monde ka ụlọikpe ukwu ahụ kpebiri ikpe wee kwuo na a ga-akwụgbu nwaanyị ahụ maka igbu nwunye di ya (co-wife) na ụmụ ya asaa. Goomenti steeti Ebonyi gbara akwụkwọ kwuru na nwaanyị ahụ bụ Agnes Nwefuru mụnyere ụlọ nwunye di ya bụ Felicia Nwefuru ọkụ nke butere ọnwụ nwaanyị ahụ na ụmụ ya asaa. E kwukwara na nwaanyị ahụ gbakwuru ụlọ nke ya ọkụ mgbe ọ na-akpa arụ ahụ ije meghaa ndị mmadụ anya; tinyere na o wepuchara ngwongwo ya na ụmụ ya niile ma kpọpụ ha n’ebe ọzọ maka ezi nchekwa tupu ọ kpaa arụ ahụ. E kwuru sị; “N’afọ 2017, ọkụ gbagburu mmadụ asatọ n’otu ezinaụlọ n’ihi ọkụ amaghị ebe o si nke gbara ụlọ ebe obibi ha n’ihe dịka elekere atọ nke ụzọ ụtụtụ n’Ogboji nke dị n’okpuru ọchịchị Ishielu na steeti Ebonyi. Mmadụ abụọ pụtara n’ọkụ ọgbụgba ahụ- nna nwe ụlọ bụ Maazị Sylvaus Nwefuru na Nwaada Ukamaka Nwefuru bụ otu n’ime ụmụ Felicia. Ọkụ ahụ gbapịara ụlọ abụọ dị n’ezinaụlọ ahụ

A mala onyeisi ụka na otu nwaanyị ikpe ọnwụ maka igbu mmadụ

NA ngwụcha izuụka gara aga ka ụlọikpe ukwu nke steeti Edo mara otu onyeisi ụka, Pastor Udoka Ukachukwu na enyi ya nwaanyị, Eniobong Isonguyo ikpe ọnwụ n’ihi ogbugbu ha gburu otu onye ọlụ nọ n’ogo dị elu na ‘Nigerian National Petroleum Corporation’ (NNPC) n’afọ 2013. Nwoke ahụ e gburu egbu bụ ‘Engineer’ Victor Gabriel Isonguyo bụ dị Eniobong. Onyeisi ụka ahụ gburu ya ma gbaa ozu ya ọkụ n’ihi na ọ tụbara nwunye ya ime. Nwoke ahụ ka e kwuru na ọ chọrọ ịmata otu nwunye ya si dị ime mgbe ya anọghị ya. Ọ bụ n’ihi nke a ka ha ji gbaa izu gbuo ya ma gbaa ozu ya ọkụ. Ka ha gbuchara ya, onyeisi ụka ahụ kwakọrọ ihe akụ akụ na ihe enwe enwe nwoke ahụ lara mmụọ, nke gụnyere ụgbọala ya nke e nwetere otu n’aka ya tinyere nde kwuru nde naira na ọtụtụ ala na ihe ndị so ya n’azụ nke ọ hafechara ka ọ bụrụzie nke ya. Justice G. Imadegbelo mara mmadụ abụọ ahụ ikpe ọnwụ site n’ịtụ ụdọ (death by hanging). Eniobong, onye nke dị ime ọnwa anọ n’oge ahụ ya bụ ihe mere ka e kwru na ọ mụọla nwa n’ụlọnga Benin.

A mala onye uweojii ikpe ọnwụ maka ịgbagbu nwata nwoke na Bayelsa

ỤLỌIKPE ukwu Bayelsa Steetị, nke dị na Yenagoa, a mala Vincent Olama, bụ onye uweoji ikpe ọnwụ maka igbu nwata nwoke gbara afọ iri na asaa nke aha ya bụ Innocent Kokorifa. Justice E. Eradiri, bụ onye lebara ya bụ ikpe anya mara Olama ikpe maka ịgbu ya bụ nwata nwoke ka ọnwa Ọgọstụ dị na mkpụrụbọchị iri na asatọ n’afọ 2016, n’Okada, nke dị na Yenagoa, bụ isi steetị ahụ. Dịka o si kọwaa, onye na ekwuru ndị nyere mkpesa kpọtara ndị akaebe iri ma nwekwaa ihe ngosi (exhibits) iri na isii iji kwado ihe ọ na-ekwu, ebe onye na-azọ onye eboro ebubo nwere sọọsọ otu onye aka ebe nke bụ ya bụ onye e boro ebubo. Ọ gakwara n’ihu kwuo na ihe atọ e jidere aka wee maa ya ikpe ọnwụ bụ na ya bụ onye nwụrụ anwụ, ọzọ wee bụrụ na ọ bụ onye ahụ e boro ebubo kpataara ya ọnwụ; nke atọ wee bụrụ na ya bụ onye kpachara anya wee mee ihe o mere nke kpatara onye nwụrụ anwụ ji wee nwuo ebe ọ maara na ihe na-eso ụdị agwa ahụ ọ kpara bụ ọnwụ ma ọ bụ imeru onye ahụ nnukwu ahụ. N’ikpeazụ, ya bụ onye ọka ikpe mara Olama i