Posts

Showing posts with the label ihe mbigbọ

N'Imo, nwoke ebeela arịrị maka nwa ya nwụrụ n'ihe mbigbọ

KA Ọ gachara izuụka olenaole mmadụ dị otu narị na iri ise n’ọnụọgụ nwụrụ n’ọkụ ọgbụgba dapụtara n’ebe a na-esucha mmanụ agbidi, nke iwu akwadoghị (illegal refinery) dị n’Abaezi, dị n’okpuruọchịchị ime obodo Ohaji/Egbema na steeti Imo; nna otu n’ime ndị ahụ ọkụ gbagburu, Maazị Uche Okwuodo enwebeghị ike ịghọta ma kwete n’ezie na nwa ya nwoke gbara afọ iri na asaa, Onyekachi Okwuodo, anwụọla pịị ma bụrụkwa onye a gaghị ahụkwa anya ọzọ n’ụwa a.   N’okwu ọ gwara ndị ntaakụkọ na nsonso a, ya bụ nwoke sị na ọ bụrụ na o nwere ka o si metụ ya n’ahụ na ọkụ ga-agbagbu nwa ya nwoke ahụ o hụrụ n’anya, na ya gaara eme ihe niile o nwere ike ime, iji hụ na ọ nọdụrụ ala n’ụlọ na gharakwa ịpụ̀ àpụ̀ ụbọchị ahụ ya bụ ihe mere.   Okwuodo, bụ onye kapịnta na nwunye ya na-azụ obere ahịa na be ha bụ Etekuru, ka a hụrụ na ha ka nọ n’oke mwute n’ihi ọdachi ahụ. Anyammiri juru ha anya n’ihi na o kweghị ha odidi.   Okwuodo, onye kabara ahụ gwa ndị ntaakụkọ okwu, kọwara otu nwa ya nwoke siri nwụ na ya bụ ọdachi,