Posts

Showing posts with the label ezi nchekwa

Ndị Anambra ekwela nkwà ezi nchekwa obodo na-izu nzukọ ọnwa Ọgọstụ

ÒTU ahụ jikọtara ndị ọrụ nchekwa dị iche-iche na steeti Anambra, bụ nke a maara dịka ‘Anambra State Security Council’ adụọla ụmụafọ steeti ahụ ka ha ghara ịtụ egwù n’ịbata ụlọ maka nzukọ ọnwa Ọgọstụ ahọ a, n’ihi na egwu ọbụla adịghị. Ndị otu a nyere ndụmọdụ a ka ha na aka na-achị steeti ahụ bụ Gọvanọ Willie Obianọ nwechara nzukọ n’ebe obibi ya dị n’Amawbịa, ma kwekwazie Ndị Anambra na a ga-aga n’ihu inwe ezigbo ọnọdụ nchekwa bụ ịgbà na steeti ahụ dịka e si enwe oge niile. N’okwu ya n’aha ndị òtù ahụ, onyeisi ndị uwe ojii na steeti ahụ, bụ Maazị John Abang mere ka a mara na ha tụlèrè ọtụtụ ihe na nzukọ ahụ, ọ kachasị dịka o siri metụta ịhụ na e nwere ezi nchekwa n’ogologo oge nzukọ ọnwa Ọgọstụ a, bụ nke na-aga n’ihu n’ebe dị iche-iche ugbu a, ya na ezi ọnọdụ nchekwa ga-adị ọkpụtọrọkpụ ma e mechagodụ ya bụ ọgbakọ. Ọ kọwara na ọ bụ eziokwu enweghị mgbagha na mpụ na arụrụala, ya na ohi na ntọrị mmadụ na-abawanyekarị ụba oge ọbụla a na-eme ya bụ nzukọ, n’ihi na ọtụtụ mmadụ na-abatakarị ụlọ;