Ndị ụka emeela emume igbu ntụ
NDỊ otu Kristi na mba ụwa niile mere mmemme igbu ntụ ụnyahụ.Ụbọchị igbu ntụ ‘ASH Wednesday’ bụ ụbọchị ndị otu Kristi ji amalite emume Lentị. Ọ bụ ụbochị a na-egbu ntụ n’egedege iru iji malite ebumọnụ na ekpere. Oge Lentị bụ oge nchịkọta onwe, oge iche echiche banyere ndụ na ịrịọ mgbahara njọ. Ọ bụkwa oge ime opipia maka njọ. Ọ bụ oge a ka e ji akwado maka mbilite n’ọnwụ Jeso Kristi. N’oge emume a, a na-eji aja maasi e bido ya. Ọ bụ n’ime ya ka a na-egbu ndị mmadụ ntụ iji gosi na mmadụ bụ ntụ, na ọ ga-alaghachịkwa na ntụ. Ọ bụ oge a ka e ji akụziri mmadụ mkpa ọ dị igosipụta ihunanya n’ebe mmadụ nọ. Oge Lentị na-egosipụta abalị iri anọ Jeso Kristi buru ọnụ n’ikpa.