Bishọp Okoye ewerela ọnọdụ dịka onyeisi ụka Katọlik, dayọsis Nnewi
BISHỌP Jonas Benson Okoye bụ onye jibu ọkwa ‘Auxillary Bishọp’ nke Dayọsis Awka buzi Bishọp Dayọsis Nnewi, ka Bishọp Hillary Paul Odịli Okeke bụ Bishọp izizi dayọsis ahụ lara ezumike. A mụrụ Bishọp Jonas Benson Okoye n’ezinaụlọ Maazị Patrick na Oriakụ Theresa Okoye, ndị Adazi Nnukwu. Ọ bụ na Kaduna ka a mụrụ ya ka ọnwa Jenụwarị dị n’abalị iri abụọ na ise, n’afọ 1963. O nwere ọkpụkpọoku ichi ụkọchukwu oge ọ na-agba odibọ maasị n’okpuru Fada Miniham, n’obichukw St Joseph’s Cathedral, Kaduna. Ọ malitere agụmakwụkwọ ukọchukwu na St Paul’s Seminary, Ukpor, n’afọ 1976/77, si ya gaa All Hallows Seminary, Onitsha. Ebe ndị ọzọ ọ gụrụ akwụkwọ tupu o chie ụkọchukwu gụnyere Bigard Memorial Seminary, Ikot- Ekpene bụ nke mechara bụrụzie St Joseph’s Major Seminary na Bigard Memorial Seminary, Enugu. Achịbishọp A.K.Obiefuna ji ọkwa dịka Bishọp Dayọsis Awka oge ahụ chiri ya ukọchukwu n’afọ 1992 na St Andrew’s Catholic Church, Adazi – Nnukwu. Dịka ụkọchukwu, ọ kọrọ n’ugbo Chineke n’ebe ọ dị ukwu