Posts

Showing posts with the label dayọsiisi Awka

N'Awka, dayọsiisi ụka Angịlịkan echiela ndị dikin ọhụrụ

Ọ BỤ nnọọ oge ọñụ na oge inye ike maka ije oziọma, dịka Bishọọpụ ụka Angịlịkan na Dayọsiisi Awka, onye bụkwa Ashbishọọpụ nke mpaghara Niger, bụ Ashbishọọpụ Alexander Ibezim chiri mmadụ anọ dikìn (Deacon) ma nyekwa ha ikike ije ozi dịka ndị nchụaja Chineke.   Mmemme ichi ụkọchukwu ahụ bụ nke e mere n’ofufe nro pụrụ iche weere ọnọdụ n’ụlọụka St. Peter’s Church’ dị n’Amawbia dị n’okpuru ọchịchị ime obodo ‘Awka South’ nke steeti Anambra, ma bụrụkwa nke dị ọrụ ụka nà ọtụtụ ndị ọzọ sitere ebe dị iche iche sonyere na ya.   Ndị Dekin anọ ahụ e chiri ọhụrụ gụnyere Eistein Emone, Echezona Chizualum, Stanley Nweke na Nnamdi Nwokoye, ma bụrụkwa ndị sitere ụlọụka ‘Anglican Church of Advent, dị na Nkpor-Uno; ụlọụka ‘Immanuel Church’ dị n’Adazi-Enu; ‘St James Anglican Church, Awkuzu’ na ụlọụka ‘All Saints Anglican Church, Nibo’ n’ótù n’ótù.   N’okwuchukwu ya n’ofufe nro ahụ nke isiokwu ya bụ “Ihe Ọ Na-Ewè Iso Ụzọ Kraịstị”, Ashịdikin nke Nibo Ashịdikinri, bụ Venerebụlụ Goodness Amaechi kọwara na a na-