‘A ga-amàchi ịhụta mmadụ dịka òsú n’ala Igbo n'afọ a’
E MEELA ka a mara na ịkpọ ma ọ bụ ịhụta mmadụ dịka òsú n’ala Igbo ga-abịa n’isi njedobe n’ahọ a, ma bụrụkwa nke a ga-amàchi kpamkpam na oge mmemme Ilommụọ Ndị Igbo nke ahọ 2018, bụ nke ga-ewere ọnọdụ n’obi Eze Nri dị n’okpuru ọchịchị Anaọcha dị na steeti Anambra. Nke a bụ nke e mere ka a mata site n’ọnụ nwa Eze Nrì, ma bụrụkwa onye enyemaka pụrụ iche nke Eze Nri n’ihe gbasara omenala, bụ Maazị Ifeanyị Onyeso, n’okwu ọ gwara ọhanaeze n’aha alaeze Nri. O mere ka a mara na ọ bụ na Nrì, bụ isi ala ndị Igbo, ka ụfọdụ omenala dị iche iche siri wee malite, nke gụnyere ịkwanyere ji ùgwù dịka eze ihe a kụrụ n’ubi, iri ji ọhụụ n’ala Igbo, òsú na ụfọdụ ihe ndị ọzọ ndị Igbo na-agbasò n’ụbọchị taa. Ọ gara n’ihu kọọ ụfọdụ akụkọ ntọala dị iche iche bànyere etu omenala ụfọdụ siri wee malite n’ala Igbo, ma kwuo na n’ihi oke mkpa ọ dị, na a ga-anọ na mmemme Ilommụọ Ndị Igbo nke ahọ a, bụ nke ga-ewere ọnọdụ n’àbalị iri abụọ na otu nke ọnwa a anyị nọ n’ime ya, n’obi Eze Nri Ènweleána (nke abụọ) Obidịegwu