Posts

Showing posts with the label ahụike

Ezi ọnọdụ ahụike so n'ihe mbụ anyị na-elegara anya – Soludo

Image
ỌCHỊORA steeti Anambra, bụ Gọvanọ Chukwuma Soludo agbapeela Izuụka ahụike na ịgba ọgwụ mgbochi ọrịa na steeti ahụ.   Gọvanọ Soludo gbapere ya bụ izuụka n’ogige nlekọta ahụike ntà, bụ Primary Health Centre, dị n’Akwaeze, n’okpuruọchịchị Anaọcha, bụkwa ebe ọ nọrọ kwuo na mmadụ ruru narị puku isii agaala ọgwụ mgbochi ọrịa nje COVID-19 n’ime steeti ahụ.   Ya bụ izuụka, nke a maara dịka izuụka ‘Maternal, Newborn and Child Health (MNCH) bụ nke a na-enwe ugboro abụọ n’ahọ ma bụrụkwa nke ọ nọrọ ụbọchị ahụ gbapee agba nke mbụ ya.   N’okwu ya oge ọ na-agbape ya bụ izuụka, Gọvanọ Soludo, nke onye nochitere anya ya bụ Kọmishọna na-ahụ maka ahụike na steeti ahụ, bụ Dọkịta Afam Obidike, kwuru na nke ahụ dabara adaba n’ezi ebumnobi ya inwoghari na ịkwàlite ngalaba ahụike steeti ahụ ka ọ bụrụ ejiamaatụ, ma kwupụtakwa olileanya o nwere na izuụka ahụike ahụ ga-enye aka n’ụzọ pụrụ iche n’imezupute nke ahụ, ọkachasị dịka o siri metụta ibelata ọnwụ nne na nwa n’ime steeti ahụ, na ịkwàlite nkụzi banyere ahụ

Ihe mere ọtụtụ mmadụ anaghị akpọ ahụike ha nnukwu ihe ugbu a

AHỤIKE bụ akụ kacha akụ mmadụ ga-akpa n’ụwa. Ọ bụ ya ka e ji ekwu sị na onye nwere ahụike nwere ndụ. Ọzọ wee bụrụ na ndụ kacha ihe niile. Ego nwere ike ịkọ mmadụ, ihe oriri nwere ike ịkọ mmadụ mana ahụike karịrị ihe ndị ahụ niile, maka na ọ bụ onye nwere ahụike na-akpata ego ma na-akpatakwa ihe ọ ga-eri.   O wee bụrụ ya, ọtụtụ ndị mmadụ anaghị enwezi ike ilekọta ahụike ha anya nke ọma n’oge ugbu a. Ị ga-ahụ onye ọrịa, ọ nọrọ n’ụlọ na-arịa ọrịa ,ọgaghị aga na nke dibịa oyibo maọbụ nke Igbo maka ịnara ọgwụgwọ kama, ọ họrọ ịnọ n’ụlọ na-agwọ onwe ya.   Ọtụtụ ihe ka e kwuru na ọ bụ ya na-ebute ọnọdụ dị otu ahụ.   Uzo Chika kwuru sị na ọ bụ enweghị ego na-eme ka ọtụtụ ndị mmadụ nọrọ n’ụlọ ha ma jiri aka ha na-enye onwe ha ọgwụ. O kwuru sị: “Ihe siri ike ugbu a. Ọ bụ onye hụ ego ọ gawa ụlọọgwụ. Olee otu onye ahụghị ego ọ ga-eji rie nri otu ugboro n’ụbọchị ga-esi nwee ike gaa ụlọọgwụ. Ego a na-akpọrọ ndị mmadụ , ọ họrọ iji aka ya agwọ onwe ya.   Mgbe ụfọdụ ka mmadụ ga-aga ụlọọgwụ, a gaghị enye

Obianọ agbapeela izuụka ahụike ụmụaka, ndị nne, na ndị mụrụ nwa ọhụrụ

AKA na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ nọrọ nanso-nso a wee mee mmemme ịgbape atụmatụ izuụka ahụike maka ndị nne, ụmụaka na ndịmụrụ nwa ọhụụ n’Akpo dị n’okpuru ọchịchị ime obodo Agụata.   Ya bụ izuụka ahụikebụ nke ebumnobi ya bụ iji kwàlite ezi ọnọdụ ahụike ụmụnwaanyị na ụmụaka, mee kaọ kawanye mma ruo ogoogo pasentị iri ise n’ime ahọ 2020, ma sikwazie n’ụzọ dịotu ahụ memìlaa ọrịa dị iche iche na-arịa ụmụnwaanyị na ụmụaka.   Gọvanọ Obianọ, onyekwupụtàra nke a oge ọ na-agbape atụmatụ ahụike ahụ, kpọkùzịrị ndị nne, ọ kachasịndị nke mụrụ nwa ọhụụ na ndị ka na-enye nwa ara ka ha kpọpụta ụmụ ha nọn’agbata ọnwa efù ruo ọnwa iri ise na iteghete, iji sonyesie ike na ya bụ atụmatụ.   O mere ka a mara na ọchịchịya arụgharịala ma dozigharịa ụlọ ahụike karịrị narị abụọ na iri ise n’imesteeti ahụ, n’ihi ezi mmasị o nwèrè n’ịkwàdò na inwògharị ngalaba ahụike steetiahụ. Ọ gakwazịrị n’ihu kwuo na ya bụ atụmatụ ahụike ga-ewerekwa ọnọdụ n’ime-imeobodo dị iche iche na gburugburu niile nke st

Anambra ga-amalite amụma ahụike maka ụmụnwaanyị na ụmụaka ụbọchị ụka

E KWUOLA ma kwekọrịta na a ga-amalite agba nke abụọ maka ahụikenke a kpọrọ 2019 Maternal, Newborn and Child Health Week (MNCHW) na agba nke mbụnke 2020 National Immunisation Plus Days (NIPDs) na steeti Anambra.   Ode akwụkwọ ma bụrụkwaonyeisi (Chief Executive Officer), Anambra State Primary Healthcare DevelopmentAgency (ASPHCDA) bụ Chioma Ezenyimulu kwuputara nke a na nzukọ State SocialMobilisation Committee nke e mere na Tuzdee na ASPHCDA.   O mere ka a mata nandị ụlọ ọrụ ahụ na ndị enyemaka ha (partner agencies) ekwekọrịtala ịmaliteMNCHW bido ụbọchị ụka ọnwa Febụwari ga-adị n’abalị iteghete wee ruo Fraideeabalị  iri na anọ n’afọ a bụ 2020.   Dọkịnta Ezenyimulugara n’ihu kwuo na a ga-eguzobe amụma ahụike a n’ụlọ ahụike ‘Government PrimaryHealthcare Centres’ nke gụnyere ụlọọgwụ ọha na eze (general), ụlọọgwụ ọzụzụ(teaching), nke ndị ụka,ndị mmadụ nwe; tinyere ịga n’ụlọ ụlọ, ụlọụka, ụlọakwụkwọ,ahịa, ama obodo, ọdụ ụgbọala nakwa ebe ọ bụla e nwere ike ịhụ ụmụaka.   Dịka o si kọwa, ndịga-e

E tòóla gọọmenti Anambra maka ezi ọrụ ya n'ịkwàlite ahụike

IGBO sị na ọ na-abụ e tòó onye gburu ewu, ọ hụ ehi, o gbuo. N’ịgbasò nke a, gọọmenti steeti Anambra nọrọ nso-nso a wee nweta òtùto site n’aka òtù ọrụ ahụike gọọmenti etiti a kpọrọ ‘National Primary Health Care Development Agency’ maka ezi ọrụ ya na ịgba dị iche-iche ọ na-eti na ngalaba ahụike steeti ahụ. Ya bụ òtùto bụ nke e kwuwàpụtàrà sit n’ọnụ ndị òtu a oge ísi ha gara kpọtụrụ aka na-achị ya bụ steeti, bụ gọvanọ Willie Obianọ n’obi gọọmenti dị n’Awka, bụ isi obodo steeti ahụ. Njem mkpọtụrụ ahụ bụ nke weere oge ndị òtù ọrụ ahụ bùrù ụzọ gagharịa n’ụfọdụ ụlọ ahụike dị iche-iche na ya bụ steeti, iji mara na ọrụ ọ na-agakwa otu o sìrì kwesi ekwesi n’imezùpùta ebumnobi ọchịchị onyeisiala bụ Buharị dịka o siri metụta ịkwàlìtè ngalaba ahụike bụ ịgbà n’ala Nigeria. N’okwu ya banyere ije ahụ ha bịara, onye duru ndị ahụ wee bịa, ma bụrụkwa onyeisi òtù ọrụ ahụike ‘National Primary Health Care Development Agency’ bụ Dọkịta Faisal Shuaibu gosipùtàrà afọ ojuju ya bànyere ihe ha hụtagàsịrị n’ụlọ ah

A dụọla ndị ọlụ ahụike ka ha dị uchu n'ọlụ

Izunna Okafor   A KPỌKUOLA ma dụọ ndị ọrụ ahụike ka ha gaa n’ihu n’itinye uchu n’ọrụ ha ma werekwa ya dịka ọkpụkpọ òkù iji wee mee ka mma ọrụ ha pụtawanye ihè. Aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ nyere ndụmọdụ a ma kpọọ oku a dịka o guzobere otu jikọtara ndị ọrụ ahụike na mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ ala anyị, bụ nke weere ọnọdụ n’isi ụlọ ọrụ steeti ahụ dị n’Awka, ma bụrụkwa nke dọtara ndị ọrụ ahụike sitere steeti ise dị na mpaghara ala Igbo. N’okwu ya ka ọ na-eguzobe ndị otù ahụ, Gọvanọ Obianọ, nke onye nọchitere anya ya bụ osote onyeisi ngalaba na-ahụ maka ọgwụ n’ụlọ ọrụ steeti ahụ na-ahụ maka ahụike, bụ Maazị Azụbụike Nwizu toro ndị òtù ahụ maka mbọ dị iche iche ha na-agba n’ịkwalite ezi ọnọdụ ahụike ụmụ mmadụ, ọ kachasị ndị nọ n’ime ime obodo, ma kwe nkwà na ọchịchị ya ga-aga n’ihu n’inye ha nkwàdo na ịdọnyere ha ukwu, dịka ha si ákwàdó ụlọ ọrụ na otu ọbụla na-agba mbọ ịkwàlite ọdịmma ụmụ mmadụ. O kwuru na ọchịchị nọ ugbu a na steeti ahụ ga-aga n’ihu n’inye ụmụafọ s