Taa, Obianọ anọọla ahọ asaa n'ọkwa dịka gọvanọ Anambra
TAA bụ Wenezdee ka ọ mere ahọ asaa kpọmkwem e jiri duo Dọkịta Willie Mmadụabụrọchukwu Obianọ n’iyi ọrụ dịka Gọvanọ steeti Anambra, ma dukwazie Dọkịta Nkem Okeke n’iyi ọrụ dịka osote ya site n’aka Ọkaikpe Peter Umeadi. Mmemme idu n’iyi ọrụ ahụ e mere n’abalị iri na asaa nke ọnwa Maachị ahọ 2014 bụ nke weere ọnọdụ n’ama egwuregwu ‘Ekwueme Square’ dị n’Awka bụ isi obodo steeti ahụ. Ka ọ gachara ahọ anọ zuru ezu ha jiri banye n’ọkwa ọchịchị ahụ, Ndị Anambra gosiri na ọchịchị Gọvanọ Obianọ dị ha mma, nke mezịrị ha jiri wee sị ya chịrị gaba n’ihu, site n’ịtụnyekwara ya na osote ya ọzọ na nhọpụta ọkwa Gọvanọ steeti ahụ e mere n’abalị iri na asatọ nke ọnwa Nọvemba ahọ 2017. Ụdị nkwàdó ndị Anambra nyere Gọvanọ Obianọ na nhọpụta ọchịchị ahụ bụ nke dara ụda ma bụrụkwa nke a gaghị echefu echefù, n’ihi na o sitere na ya wee bụrụ gọvanọ mbụ n’ala Nigeria nwetara nturuugo n’ime okpuru ọchịchị niile e nwere na steeti ya. Ka nke ahụ gachara, a nọkwara n’abalị iri na asaa nke ọnwa Maachị, ahọ 2018 w