Posts

Showing posts with the label Zimbabwe

Ọnwụ nwata afọ iri na anọ nwụrụ ka ọ na-amụ nwa n'ụlọụka na Zimbabwe akpasuola ụmụ ụwa iwe

 NDỊ uweojii mba Zimbabwe na-eme nnyocha ugbu a banyere nwata nwaanyị gbara afọ iri na anọ nwụrụ ka ọ na-amụ nwa, bụ nke butere nkatọ site n’aka ndị mmadụ.   Nwata nwaanyị ahụ aha ya bụ Memory Machaya ka e kwuru na ọ nwụrụ n’ọnwa gara aga n’ime ụlọụka (church shrine) dị na mpaghara Marange.   Okwu ahụ agbaala mmegbu na mmetọ a na-eme ụmụaka n’anwụ dịka e kwuru na a manyere ya ka ọ kwụsị akwụkwọ, ma lụọ dị.   United Nations akpọkuola gọọmenti ahụ ka ọ hụta alụmdi ụmụaka dịka arụ ma weta ya bụ ọnọdụ n’isi njedebe.   Òtù ahụ kwuru na o ji oke mwute wee katọọ mkpesa maka ihe niile butere ọnwụ nwata ahụ.   O kwuru sị: “Ihe niile na-eme ugbu a banyere mmegbu a na-emegbu ụmụnwaanyị (ma okenye ma ụmụaka) na Zimbabwe, gụnyere ikebe ụmụaka alụmdi agaghị na-agakwa n’ihu.”   Ọnwụ nwata ahụ n’abalị iri na ise nke ọnwa Julaị ezipụtala nkwenye nke alụmdi ụmụaka n’ime Zimbabwe’s Apostolic Church, bụ ndị na-ajụkarị  ịnara ọgwụ na ịzọ ndụ n’ụlọọgwụ.   Otu o sila dị, ezinaụlọ nwata ahụ kwuru na nwa a mụr

Na Zimbabwe, ndị akwụnakwụna na-anazi ọka na agwa

ỤMỤNWAANYỊ ji ahụ ha akpa ego (ndị ashawo) na Dema Growth Point bụ obodo dị na Zimbabwe na-anabatazi ihe nri (foodstuff) dịka bokeeti ọka, na iko agwa dịka ụgwọ ọrụ ha site n’aka ụmụnwoke na-atụnyere ha.   N’oge ugbu a, ụkọ ego ji ndị mmadụ aka, ọtụtụ na-emezi ihe ọbụla iji dị ndụ. Ụfọdụ ndị ashawo na Zimbabwe ekwuola na ha na-anabatazị ihe oriri dịka ụgwọ ọrụ ha, ma ha nyechaa ndị na-atụnyere ha ihe na chọrọ.   Ụfọdụ ndị ashawo ahụ kpọkuru gọọmenti mba ahụ na ndị nnọrọonwe ka ha gbazinye ha ego nke ọmụrụnwa ya agaghị ebu ibu ka ha were malite ihe (business) ha chọrọ ime, iji wee nyere ezinaụlọ ha aka wee nwee ike hapụ iji ahụ ha akpa ego maọbụ agba ashawo.   Otu n’ime ha aha ya bụ Alice kwuru sị: “Oge agaala oge anyị na-ana ọnụego US $5 maka abalị niile. Ugbu a anyị na-anabata ọbụladị otu dọla iji nwee ike gote akwụkwọ nri na tomato were siere ụmụ gị agụụ na-agụ ihe.”   Onye ashawo ahụ Alice gwara ndị ntaakụkọ na ya na-agba ashawo n’ihi na ya ga-elekọta ezinaụlọ tinyere ụmụ atọ ya any

Na Zimbabwe, a kpọchibidola mmadụ dị otu narị na iri ise n'ụlọọrụ ha kemgbe ọnwa ise n'ihi ụjọ Korona

O PEKATAMPE, mmadụ dị otu narị na iri ise n’ọnụọgụ bụ ndị na-arụ ọrụ n’otu ụlọọrụ ndị China dị na Zimbabwe ka a kpọchịbidoro n’ụlọọrụ ha kemgbe ọnwa ise, ka ha ghara ikesa ọrịa Korona. Ụlọọrụ ahụ bụ Diamond Cement nke dị n’akụkụ Kwekwe na mba Zimbabwe ka e kwuru na ndịisi dọrọ ndị ọrụ aka na ntị ka ha nọ nzukọ na onye ọbụla si n’ụlọọrụ ahụ pụọ na a gaghị anabatakwa ya ọzọ. Ya mere, ndị ọrụ ahụ nọ n’ụlọọrụ ahụ n’ahụhụ n’ihi na ọnọdụ ha nọ adịghị mma nke gụnyere ịrahụ ụra n’akpati kọntena (cargo container). N’akụkụ nke ya, okwuputa okwu ụlọọrụ Diamond Cement gwara ndịntakụkọ sị na onweghị onye a manyere amanye ịnọ n’ụlọọrụ ahụ n’ihi na ha tinyere aka n’akwụkwọ ma kweta. Ọ kọwara na a na-eleta ha nke ọma dịka a na-etinyere ha ọmụmụ nwa (bonus), nri na ihe ndị ọzọ. Otu o sila dị, odeakwụkwọ Zimbabwe Congress of Trade Unions bụ Japhet Moyo kwuru sị na ọ bụrụ na kọmpịnị jide ndịọrụ n’ụlọọrụ ihe karịrị izuụka abụọ, ọ dịghị mma; ma kwuo na ọ ga-eziga otu ndị ga-aga n’ụlọahụ ahụ maka ileru anya

Na Zimbabwe, otu nwaanyị azọpụtala nwa ya n'ọnụ agụiyi

N’EZIOKWU, ịhụnanya nne nwere n’ebe nwa no dị egwu. Ya mereotu nwaanyị azopụtala nwa ya n’aka agụiyi bịara igbu ya. Nwaanyị ahụ gbara afo iri ato, aha ya bụ Maurina Musisinyanaka e kwuru na o hapụrụ ụmụ ya abụo n’akụkụ orimiri Runde nke dị na Zimbabwe kaha gwube egwu dịka o gara ịkụ azụ. Ka nwaanyị ahụ no na mmiri akụ azụ, ọ nụrụ mkpu wee gbaragaba. Mgbe o ruru, o hụrụ ka agụiyi bu nwa ya nwoke, Gideon gbara afo ato agbapụ.Odogwunwaanyị ahụ wakporo agụiyi ahụ ozugbo, were otu aka pịchie ya imi nke mere ka ohapụ nwata ahụ.Otu o sila dị, agụiyi ahụ tara ya n’aka ebe e buru nwata ahụ nkeahụ ya bụ obara obara, nke ekuteghịzi ume nkeoma gaa ụloogwụ. Ma ka o dị ugbua, nwata ahụ agbakeela. Murina, onye nke si Chihosi Chiredzi kwuru sị, “Apịchisirim imi agụiyi ahụ ike bụ ihe nke m mụtara site n’aka ndị okenye oge tere aka.Eji m aka nke ozo wee napụta ya isi nwata ahụ nke o tadosiri ike.Ma ruo taa,ekwetabeghị m na azopụtara m nwa m.” Otu o sila dị, a na-akowa na agụiyi na-awakpo ihe karịrịmmadụ