Ndị uweojii azọpụtala mmadụ atọ ndị ntọ zoro n'ime ọhịa Zamfara
MMADỤ atọ ndị ntọ jidere ma zoo n’ime ọhịa Kunchin Kalgo dị na steeti Zamfara abụrụla ndị nweere onwe ha, dịka ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa steeti ahụ zọpụtàrà ha n’ebe e zoro ha. Onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii na steeti ahụ, bụ Mohammed Shehu bụ ya kwupụtara nke a n’ozi ọ kụpụụrụ ndị nta akụkọ, bụkwa nke o sitere na ya kọwaa na ọ bụ oge ndị uweojii ahụ na-awagharị n’ime ọhịa ahụ na-achọ ndị omekoome na ndị e ji eji ka ha hụrụ ma zọpụta mmadụ ise ahụ, bụcha ụmụnwoke. Dịka ọ na-akọwa na ọ bụ n’okpuru ọchịchị ime obodo Tsafe ka ime ọhịa ahụ dị, o mèkwàrà ka a mara na mmadụ anọ n’ime ndị ahụ a zọpụtàrà bụ ndị sitere okpuru ọchịchị ime obodo Zuru, nke steeti Kebbi, ma bụrụkwa ndị a tọọrọ n’ogologo ụzọ awara awara ahụ siri Yankara gaa Tsafe. O kwukwazịrị na otu onye nke ọzọ bụ onye a tọọrọ na mpaghara okpuru ọchịchị ime obodo Kontagora nke steeti Niger. Maazị Shehu gàkwàzịrị n’ihu kwuo na ndị ahụ nọrọ mkpụrụ ụbọchị iri na otu n’ime ọhịa ahụ n’aka ndị ahụ tọọrọ ha.