Posts

Showing posts with the label Yahoo-Yahoo

A tụọla mmadụ 7 nga n'Enugu maka 'Yahoo Yahoo', jidekwa otu Pastọ

Image
 Ọ NA-ABỤ agadi nwaanyị kachie ntị wụ̀ọ́ aja, e bute ozu ya n’ófè nke ọzọ.   Ka ọ dị taa, ụmụokorobịa asaa ahụ zuru òkè abụrụla ndị a tụrụ nga na steeti Enugu maka itinye aka n’ígwù ojoro site n’usoro ịntanetị, nke a maara dịka ‘Yahoo Yahoo’.   Ọ bụ Ọkaikpe I. M. Buba, nke ụlọikpe ukwu dị n’Enugu mara mmadụ asaa ndị ahụ ikpe n’ótù n’ótù maka ihe dị icheiche ha mèrè, nke gbadoro ụkwụ n’ikwu na ha bụ onye ha abụghị, ya na inweta ego site n’usoro ụgha na igwu ojoro, nke ha mere ọtụtụ ndị sitere mba ofesi dị icheiche aka ha dị ọcha.   Ụmụokorobịa asaa ahụ a mara ya bụ ikpe gụnyèrè Enegide Ifeanyi Kizito, Chukwuajama Collins Arinze, Victor Udekwe, Chukwudi Emmanuel, Nwafor Clinton Chetachi, Utogbo Joseph na Omilo Collins Chimere.   Ọ bụ ụlọọrụ ahụ na-ahụ maka ibu agha megide ịmazụ̀ ego ọhaneze na iri ngarị n’ala Nigeria, bụ ‘Economic and Financial Crimes Commission (EFCC)’ nwụchiri ndị ahụ, gbaa ha akwụkwọ, ma kpụpụkwa ha ụlọikpe.   N’otu n’ime ebubo ahụ e boro ha, EFCC kwuru na otu onye n’

A nwụchiela onye NYSC, ndị ọzọ maka ‘Yahoo Yahoo’ na Kogi

ỤLỌỌRỤ ahụ na-ahụ maka ibu agha megide igwù ojoro na ịmazụ ego ọhaneze n’ala Nigeria, bụ ụlọọrụ ‘Economic and Financial Crimes Commission (EFCC)’ anwụchiela mmadụ iri na iteghete a na-enyo enyo na ha bụ ndị na-egwu ojoro site n’usoro nzikọrịta ozi ọgbara ọhụrụ ịntaneetị, bụ ndị a maara dịka ndị ‘Yahoo Yahoo’.   Dịka ozi a kụpụrụ na nsonso a site n’aka onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ụlọọrụ EFCC, bụ Maazị Wilson Uwujaren siri kọwaa, otu onye n’ime mmadụ iri na iteghete ahụ e jidere bụ nwokorobịa ji otu ahọ efe ala nna ya n’okpuru usoro atụmatụ ‘National Youths Service Corps (NYSC)’ na steeti Kogi, bụ Adamu Shuaibu, tinyere mmadụ iri na asatọ ndị ọzọ.   Maazị Uwujaren mèkwàrà ka a mara na ọ bụ na Lokoja bụ isi obodo steeti ahụ ka a nwụchiri ndị ahụ dịka e nwètèrè ozi banyere ebe dị icheiche ha nọ na ihe nọkwa ebe ahụ eme.\Dịka o siri kwu, mmadụ iri na asatọ ndị ọzọ gụnyere: Nelson Ojonoka, Victor Atsumbe, Akoh Grace Samuel, Usman Abubakar Sadiq, Jacob Emmanuel, Solomon John, Christ

Aka EFCC akparala mmadụ 42 n'Awka, Enugu maka Yahoo-Yahoo

IGBO sị na ọ na-abụ onye a gwara agwa ma ọ nụghị anụ, o mee emee, ọ hụ ahụ.   Ka ọ dị taa, ụlọọrụ ahụ na-ahụ maka ibu agha megide igwù ojoro na ịmazụ ego ọhaneze n’ala Nigeria, bụ ụlọọrụ ‘Economic and Financial Crimes Commission (EFCC)’ anwụchiela mmadụ iri anọ na abụọ a na-enyo enyo na ha bụ ndị na-egwu ojoro site n’usoro nzikọrịta ozi ọgbara ọhụrụ ịntaneetị a maara dịka ndị ‘Yahoo Yahoo’.   Dịka ozi a kụpụrụ na nsonso a site n’aka ngalaba na-ahụ maka mgbasaozi n’ụlọọrụ EFCC, siri kọwaa, mmadụ iri na iteghete n’ime ndị ahụ bụ ndị a nwụchiri n’Awka bụ isi obodo steeti Anambra, ebe mmadụ iri na atọ ndị ọzọ bụ ndị a nwụchikọrọ na steeti Enugu dịgbàdò na mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ ala Nigeria.   Ụlọọrụ ahụ nyèkwàrà aha ndị ahụ dịka Chimezie Anyamutaku, Chinonso Dominic, Onyekachi Nwankwo, Ikenna Austin, Chinonso Anthony Caesar, Felix Okechukwu Chikagu, Dera Okoye, Victor Onyebuchi, Emmanuel Ifeanyi, Emeka Izu John, Raphael Gbughemobi, Okorie Charles, Onyeoji Chukwuemeka, Enem Bontis Obi