Posts

Showing posts with the label Winifred Moneme

Sista Moneme, onye Anambra eturula ugo dịka onye nke abụọ gụrụ ‘Canon Law' na Nigeria

 IGBO kwuru sị na dimkpa taa akị ahụ ichere ya. Rev. Sista Winifred Moneme, onye so na mmadụ dị narị asatọ na iri asatọ (880) n’ọnụọgụ ndị a kpọbatara n’otu ndị ọka ikpe (Bar) kpara ike dị egwu site n’ịbụ onye Nigeria nke abụọ gụrụ ihe ọmụmụ ‘Canon Law’.   Sista Moneme, onye Agulu, nke dị n’okpuru ọchịchị Anaocha, na steeti Anambra gụrụ akwụkwọ n’ụlọakwụkwọ ndị a: Catholic Institute of West Africa; Catholic University of Eastern Africa (ebe o nwetere nzere digrii na ‘Canon Law’); Urban University Rome, Italy (ebe o nwetere nzere Diploma n’asụsụ Italy (masters, Civil Law); Pontifical University Lateran (Phd. Civil Law); Pontifical University, Rome (Phd. Civil Law) na Nigerian Institute of Chartered Arbitrators.   Ihe ọmụmụ ‘Canon Law’ bụkarịrị ihe gbasara iwu na-achịkwa obodo ndị otu Kraist, ọ kachasị ụka Katọlik. Sista Moneme, nke otu Sisters of Jesus the Saviour, steeti Rivers gụrụ ihe banyere iwu ụzọ abụọ, ‘Civil Law’ bụ iwu na achịkwa obodo na ‘Canon Law’ bụ nke ụka; ma gụrụ ha abụọ