Posts

Showing posts with the label Wikipedia Igbo

Akuzierela ndị edemede ka e si ede Igbo na Wikipedia n’Awka

ỌGBAKỌ nkụzi mkpụrụ ụbọchị abụọ banyere etu e si ede, etinye, emezi maọbụ atụgharị edemede na Wikipedia Igbo abịla n’isi njedobe, dịka a kpọkuru ndị Igbo ka ha teta n’ụra ma bido ịkọ akụkọ ha na ide ihe banyere ha, karịa ịhapụrụ ya ndị mba ọzọ ka ha deere ha.   Ya bụ ọgbakọ nkuzi, nke a kpọrọ ‘Ọzụzụ Igbo Wikupedia Awka’ bụ nke weere ọnọdụ n’izuụka a n’ọba akwụkwọ steeti Anambra dị n’Awka, ma bụrụkwa nke dọtara ndị ọrụ ọba akwụkwọ, ndị nkụzi, ndị nta akụkọ, ndị odee, ndị ọrụ oyibo, ndị ntorobịa, na ọtụtụ ndị ọzọ.   N’okwu ya na mmemme ahụ, onye nhazi òtù ‘Igbo Wikimedian User Group’ na steeti Anambra, bụ Oriakụ Onyinye mere ka a mara na ebumnobi ya bụ ọgbakọ bụ iji nye ndị mmadụ nkụzi na mgbàzi banyere etu ha ga-esi na-etinye ihe na Wikipedia, site n’idegharị, ịtụgharị, idenye maọbụ ibipụta edemede ọhụrụ na Wikipedia, ọkachasị n’asụsụ Igbo.   O mere ka a mara na Wikipedia, nke e wepụtara n’ahọ 2001 bụ ebe mmadụ pụrụ isi jiri usoro ịtaneetị wee chọpụta maọbụ nweta ihe dị iche iche dịka ọ