Posts

Showing posts with the label Wikimedia Fan Club

E guzobela otu jikọtara ndị Wikimedia n'Anambra

Ọ BỤ nnukwu ọgbakọ ndị ụbụrụ ha na-aghọ nkọ na ndị nwere mmasị pụrụ iche, dịka e guzobere otu jikọtara ndị na-edezi edemede maọbụ na-etinye edemede ọhụrụ, foto maọbụ ihe ndị ọzọ na Wikipedia n’ime steeti Anambra.   Ya bụ mmemme bụ nke weere ọnọdụ n’isi ụlọọrụ ‘Nigerian Book Foundation’ dị n’Awka bụ isi obodo steeti Anambra, ma bụrụkwa nke dọtara ọtụtụ ndị mmadụ, nke gụnyere ndị na-arụ n’ọbá akwụkwọ, ndị na-edemede, na ọtụtụ ndị ọzọ.   Òtù ọhụrụ ahụ bụ nke a kpọrọ ‘Anambra Network of Wikimedia Usergroup’ nke ‘Wikimedia Usergroup Nigeria’ ma bụrụ nke a họpụtara Dọkịta Ngozi Perpetual Osuchukwu dịka onyeisi ya na steeti Anambra. A họpụtàkwàrà Dọkịta Nkem Osuigwe dịka onye ndụmọdụ nke òtù ahụ, họpụta Adaora Obuezie na Timothy Chibuike Ezenwanne dịka Osote Onyeisi.   N’okwu ya na mmemme ahụ, onyeisi òtù Wikimedia Usergroup Nigeria, Maazị Olushola Olaniyan nyèrè nkọwa banyere ihe òtù ahụ pụtara na ihe ha na-eme, ma kọwaa ihe mere o jiri dị mkpa na ha guzobere ngalaba òtù ahụ na Steeti Anambr

Ndị 'Wikimedia Fan Club' enweela ọ́gbakọ̀ nkụzi Ọzọ n'Awka

KA Ọ gachara izuụka olenaole e mechara agba nke mbụ ya, agba nke abụọ nke ọgbakọ inye nkụzi banyere idezi, ịtụgharị, itinye na ibipụta okwu ọhụrụ na Wikipedia ewerela ọnọdụ n’ogige ‘Ekwueme Centre for Disciplinary Research’ dị n’ime mahadum Nnamdị Azikiwe dị n’Awka bụ isi obodo steeti Anambra. Ọgbakọ inye nkụzi ahụ bụ nke a na-achịkọba na mgbe na mgbe site n’aka ndị otu ‘Wikimedia Fan Club’, ma bụrụkwa nke a nọrọ na ya wee kpọkuo ndị Igbo ka ha nye aka n’ichekwaba, ịkwàlite na ime ka ya bụ asụsụ Igbo ná-ewu èwù n’ogoogo mba ụwa. N’okwu ya na mmemme ahụ, onye chịkọbara ya bụ ọgbakọ ma bụrụkwa onye hibere òtù ‘Wikimedia Fan Club’, bụ Oriakụ Obiageli Ezeilo, onye ihe gbasaara nkwàlite asụsụ Igbo na-atọ ụtọ nke ukwuu, yèrè nkọwa banyere WIkimedia Foundation ya na ụmụnne ya ndị ọzọ yiri ya, nke gụnyere Wiki Books, Wiki Voyage, Wiki Quotes, Wikisource, Wikitionary, na ọtụtụ ndị ọzọ. O kwùrù na ebumnobi o jiri hibe òtù ahụ nà atụmatụ ahụ bụ iji kwàlite ma bawanyekwuo ọnụọgụgụ edemede na okwu