Otu ụmụnwaanyị ajadu ebidola izuụka ihe ọmụmụ aka ọlụ
OTU ndị ajadu a kpọrọ Virtuous Widows Association mpaghara South South na South East emeela ọgbakọ nkuzi maka ndị ajadu. Ha mere nke a iji kụziri ha ọrụ aka dị iche iche dịka; isi nri, ịkwa akwa, ịsụ ịchafụ, ime ncha w.d.g. Ọ bụ n’ụlọ ezumezu nke Anambra Newspapers and Printing Corporation (ANPC) ndị na-ebipụta akwụkwọ akụkụ National Light, Ka Ọ Dị Taa na Sportslight Xtra ka ha nọrọ wee me ya. Ọgbakọ a kpọkọtara ọtụtụ ndị obodo jiri biri ndị gụnyere HRM Igwe Benneth Izuchukwu nke Umuleri, onye hibere otu ahụ (founder) Oriakụ Ifeyinwa Egbosiba, onyeisi (MD/CEO) Anambra Newspapers and Printing Corporation (ANPC) Sir Chuka Nnabuife, Editọ bụ Oriakụ Rose Oranye, ndị nchịkọba (coordinators) otu ahụ Oriakụ Caroline Anoka, Oriakụ Hope Ekesiuba, Oriakụ Juan Ubaka na ndị ọzọ. Nwunye aka na-achị steeti Anambra bụ Dọkịnta Ebelechukwu Obiano na kọmịshọna na-ahụ maka ọdị mma ụmụnwaanyị Lady Ndidi Mezue bụ ndị nke onye sị na ngalaba na-ahụ maka ụmụnwaanyị (director state Ministry of Women Affairs) O