Posts

Showing posts with the label Ven. Obiora Cyprain Alokwu

Alokwu emeela ncheta ọgbụgba afọ iri abụọ na ise o jiri chi ụkọchukwu

Image
ỤLỌỤKA Anglican nke Redemption, Awka, dị n’isi obodo Steeti Anambra juru kpụmkpụm n’ọnụ na nsonso a dịka imirikiti mmadụ jupụtàrà n’ebe ahụ isoro onyeisinchụaja n’ụlọụka ahụ, bụ Ven. Dkt. Obiora Cyprain Alokwu na ezinụlọ ya wee ṅụ̀rịa n’emume ncheta ọgbụgba afọ iri atọ e jiri chie ya ụkọchukwu.   Oké mmemme ahụ e jiri òfùfènro Oriri Nsọ wee malite, bụ̀kwà nke  ndịisi ụka, ọtụtụ ndị ụkọchukwu na mmadụ karịrị narị ise n’ọnụọgụgụ sònyère na ya. A nọkwàrà na ya bụ mmemme bupụ̀ta akwụkwọ ọhụrụ a kpọrọ ‘The Church and Community Development: A New Perspective on Theology and Development Studies’, nke Ven. Alokwu dere.   Na nkenke okwuchukwu ya na mmemme ahụ, Bishọp Paul Udogu nke Dayọsis Afikpo, onye kọrọ akụkọ banyere arụmọrụ ụka na agụmakwụkwọ Ụkọchukwu Alokwu wee ruo ogoogo ọ nọ na ya ugbua, kwuru n’ezie na ọganihu ahụ o nwetere n’ihe ndị ahụ niile bụ n’ihi amara Chineke jupụtàrà na ndụ ya.   Otú ọ dị, ọ gbara ndị otu Kraịst ume ka ha na-akwado ma na-ekpekwara ndị ụkọchukwu ha ekpere mgbe