Udodimma 'Primary School' Okpuno e meela emume nturu ugo mmụta
Chinwendu Uzoatu EMUME nturu ugo mmụta dara ụda n’Udokamma ‘Primary School’ Okpuno, nke dị n’okpuro ọchịchị Awka ‘South’ na steeti Anambra, ụbọchị ụka gara aga Onye nlekọta ụlọakwụkwọ ahụ bụ Rev Fr. Fidelis Chijioke Izuakor, nọkwazi ụbọchị ahụ cheta otu afọ o ji chie ụkọchukwu. E ji aja maasị dị asọ wee malite mmemme a na ‘St Gabriel’s Catholic Church,’ Okpuno, ebe a nọ kelee Chineke maka afọ ọma ya. Mgbe a gbasara ụka ka a nọzị n’ihu ụlọakwụkwọ ahụ nke dịkwazị n’ogige ụlọ ụka ahụ wee metọpụ mmemme. Ndị mmadụ si n’ugwu na ndida ju ka igwurube wee nonye ma nye nkwado ha. ‘Rev Fr. Prof.’ John Oraemesi, n’ekpere mmalite, kenere Chineke ma hafee ihe nile n’aka ya ebe ụkọchukwu parish bụ Rev. Fr. Anthony Nwafor, mgbe ọ na-agọ ọji gọtaara mmadụ nile ndụ makana oke dibịa chụọ aja, ọ dịka e were ya nye ndị mmụọ n’aka. Onye isi oche mmemme ahụ bụ Walter Umeukeje nyere ha nkwado ya ma jakwaa ha ike. N’okwu nke ya, onye nlekọta ụlọakwụkwọ ahụ bụ ‘Rev Fr’. Fidelis Izuako kelere Chineke maka ụbọc