Posts

Showing posts with the label Upper Iweka

Ndị uweojii Anambra ejidela ndị ohi ọzọ n'Upper Iweka

IGBO kwuru sị na a naghị aka àkà eje nka agwọ, kama na ọ bụ agwọ pụta, a chụba. O wee bụrụ otu ahụ ka ndị uwe ojii na steeti Anambra (n’okpuru atụmatụ Puff Adder) siri wee nwụchikọọ ụfọdụ ndị ọzọ a na-enyo enyò na ha bụ ndị oji ụgbọala ezu ohi (a maara dịka ‘one chance’) na ndị na-apụnara mmadụ ihe n’ike na mpaghara Upper Iweka dị n’Ọnịtsha na steeti ahụ. Nke a bụ nke a gbaara ụwa n’anwụ site n’ozi a kụpụrụ nso-nso a n’aha onyeisi ndị uwe ojii na steeti ahụ, bụ Maazị Mustapha Dandaura, ma bụrụkwa nke onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uwe ojii na ya bụ steeti, bụ Maazị Harụna Mọhammed bìnyere aka na ya. Dịka ya bụ ozi siri kọọ, ndị ahụ e jidere so na ndị na-eyí ụmụ mmadụ égwù na mpaghara ebe dị iche iche n’Ọnịtsha, ọ kachasị na mpaghara Upper Iweka na mpaghara ụzọ awara awara ahụ siri Ọnịtsha gaa Asaba; ma bụrụkwa ndị a chọpụtara, site na nnyòcha mmalite e mèrè, na o teelarị ha jiri wèrè ụgbọala (e ji ebu ndị njèm) akara ya bụ XD 364 AGL, bụ nke na-acha ọcha ma na-achakwa edo èd