Okafor agaala njem nleta ọrụ n'ahịa mba ụwa a na-arụ n'Umunze
KỌMISHỌNA steeti Anambra na-ahụ maka ahịa na azụmahịa, bụMaazị Uchenna Okafor ekwupụtala afọ ojuju ya banyere etu ọrụ si aga n’ọdụ ebeahụ a na-arụ ahịa ọgbara ọhụụ mba ụwa, bụ ‘Ultra Modern International Market’ dịn’Ụmụnze. Maazị Okafor kwupụtaranke a oge ọ gara ileta ka ọrụ si aga n’ebe ahụ a na-arụ ya bụ ahịa n’Ụmụnze dịn’okpuru ọchịchị ime obodo ‘Orumba South’ na steeti ahụ. O kelere onyeisi ụlọọrBills Limited, bụ Maazị Ben Oranusi maka etu ọrụ ahụ si agawanye n’ihu, ọkachasị na mpaghara ebe ahụ a ga na-ere ihe a kọtara n’ugbo, ma mekwa ka a marana a ga-akpọpụ ndị niile na-ere ihe a kọtara n’ugbo n’akụkụ okporo ụzọ ma kpọbataha ka ha nọrọzie n’ebe ahụ wee rebe ahịa ma ọ bụrụ na a rụchaa ya. Na ntụnye nke ya ogeọ na-edugharị Kọmishọna ahụ n’ihu ọrụ ahụ, Maazị Ọranụsị kelere gọọmenti makamaka ọrụ ngo ahụ, ma kọwaa na ahịa ahụ ga-enwegbàdo akụrụngwa dị iche iche e jienyere ndụ aka na ọdụ ụgbọala kacha buo ibu na mpaghara ndịda ọwụwa anyanwụ alaNigeria ma a rụchaa ya bụ ahịa. O